"New World Order Bible Versions" (Igbo subtitles)

Watch Video

October 12, 2015

Ekwenyere m na ekwensu chọrọ iweghara chọọchị.

Ekwenyere m na ekwensu chọrọ iweghara chọọchị...

Otu onye otu mgbe

-Anyị nwere nnukwu ohere ịnọkọ ọnụ ma kwụsie ike

maka ọgbọ n'abịa n'ihu nke ụwa ọhụrụ

Mechie windo gị

Laghachi azụ n'ụlọ gị

Banye n'ime ugbu a! Anọ m n'ime

-Anyị nwere ohere maka ụwa ọhụrụ nke ka mma,...

...Usoro nke mba ụwa nke Unịated Neshọn ga-ahazi...

-...mgbọ rọba na egbe

ga-eji ọrụ ime udo ha maka imezu nkwa na atụmanya

...nke ndị guzobere UN.

-Mgbe afọ gasịrị, Bush sịrị - n' ọbụ okwu m n'ejikarị eme ihe.

Mụ - n'anyị chọrọ ụwa ọhụrụ ahaziri nkeọma

Mana kama nke ahụ anyị n'ahụ ọgbaghara

-Owela oge ịbịa.

N'ihi ihe ndị anyị mere n'ụbọchị taa n'oge a.

Mgbanwe abịala na Amerịka.

Onyeisiala bụ Ọbama na onye mịnịsta Briten bụ Gọdọn taa

n'akpọ oku maka ụwa ọhụrụ nwere ezi nhazi iji lebara nsogbu mba ụwa na

nsogbu akụnụba anya.

- Ibuọrụ anyị nwere ugbu a bụ inyeaka kewapụta

ụwa ọhụrụ

-Ọrụ ya ga-abụ imepe ọnọdụ mara mma maka Amerịka

N'oge a mgbe, n'ezie, ikepụta ụwa ọhụrụ ga-abụ ihe ga-ekwe omume

ọbụ nnukwu ohere.

-Ị na-ekwu banyere ụwa ọhụrụ dịka isi mara ya

nkwenye onye ọbụla kwenyere n'onwe ya -Ee

-Kedu ka isi mara nke ahụ?

- Nchọpụta m mere weghachiri m azụ n'ihe dọla Amerịka nọ na ya.

Ahụrụ ihe eji machie ihu ya ebe a nke dị ịtụnanya. Ha bụ ejirimara iluminati

nke bụ otu nzuzo nke eguzobere kemgbe

site n'aka otu nwoke aha ya bụ Adam Weishaupt

N'azụ dọla ahụ ị ga-ahụkwa ejirimara

n'akaekpe ma nwekwa anya gbara ụzọ anọ. Ọbụ anya Horus

n'akụkọ ifo nke ndị Ijipt, nka a na-akpọ ugbu a anya Lucifa maọbụ ekwensu

okwu abụọ dị ya n'elu bụ, "ANNUIT COEPTIS" nke pụtara

"Ikwuputa ọmụmụ nke",

N'okpuru ya "NOVUS ORDO SECLORUM".

-Njirimara nke a dị egwu ka mba Unaịted Steeti Niuere

Nhazi ọhụrụ. "NOVUS ORDO SECLORUM"

- ndị mmadụ n'ajụ ajụjụ bụ, "Gịnị ka nnukwu ihe owuwu ejiri mara Ijipt

N'eme n'azụ ego mba Amerịka

Kedu ihe jikọrọ Amerịka na Ijipt"

Azịza ya bụ: Onweghị ma ọlị naanị n'ihe banyere otu nzuzo

Nke mere na ndị anyị na ha n'emekọ ihe bụ ndị ha n'ekwensu n'enwe mmekọrịta.

Ndị mmadụ kwesịrị ịma na chi nke ndịotu nzuzo ndịọjọọ ga-edu ụwa.

Nke doro anya Amerịka nọ n'isi ya

nke eji guzobe ya, nke ga-edu ụwa n'ọnọdụ

Otu ọchịchị, otu okpukpe

Nke otu iwu, na nke otu ego maka ụwa niile.

Nke Baịbụl kpọrọ akara nwa anụ ọhịa.

Nke anyị mara nkeọma n'ọbụ eziokwu,

nke n'aga enwe mgbanwe, nke ọnọdụ ochie

banye na nke ọhụrụ, ọchịchị nke Setan ga-achị

ọbụ ya ka njirimara a nọchịrị anya ya

ọbụkwa ya ka ụwa ọhụrụ nọchịrị anya ya.

Na Kịng Jems, Kọrint : sịrị. "ya mere ọbụrụ na onye ọbụla

anọrọ n'ime Kraịst, ọbụ onye amụrụ ọhụrụ: ihe ochie agabigala; ma lee

ihe niile dị ọhụrụ". Leenu ka Niu Inglish Baịbụl

si dee ya; Okwuru "Ihe ochie agaala

nhazi ọhụrụ esochiela." ha ji otu asụsụ mee ihe.

Kịng Jems Kwuru, " Ihe kwuchiri naanị n'etiti anụ na mmanya, na

ime nsachasị n'ụdị dị iche iche, n'omume anụ ahụ, nke ewebatara ruo mgbe

nke edoziri ga-esochi", n'ekwu banyere ọbịbịa Kraịst. Mana cheta

NIV kpọrọ ya, "ruo mgbe ụwa ọhụrụ" ha n'akwado

maka ndị mmadụ. Ugbu a achọrọ m ka ịchọpụta ihe a.

Kịng Jems Baịbụl kwuru sị, "Ya mere ka Onyenweanyị Chineke kwuru, lee ana m egwunye

na Zayọn nkume mgbidi, nkume siri ike, dị okeọnụ

mgbidi siri ike". Onye a na-ekwu maka ya bụ Jizọs,ọbụ ya?Achọrọ m ka ịmata

na Kịng Jems, a na-agwa gị na Jizọs

bụ nkume nọ na nkuku mgbidi, ugbu a keduzi ntọala nke iheowuwu

nke nọ n'elu maọbụ na mgbada

ọnọrọ n'okpuru, ọ bụghị ya, ọdị mma?

ya mere mgbe asị na Jizọs bụ isi nkume nke nkuku mgbidi

ọbụ ya dị n'okpuru ebe a, ọbụ ya?

"Nye ndị niile kwere - ọdị okeọnụ:" ka Kịng Jems kwuru

Mana nye ndị n'enupu isi, nkume nke ndị n'ewu ụlọ jụrụ

bụzi isi nkume," ọzọkwa na nkuku mgbidi.

Mara na NIV kpọrọ ya isi nkume

ha n'ekwu n'ihe ngosi nke ịhụrụ n'anọchi anya Kraịst.

ọbụghị ya; onye ka ọnọchiri anya ya? Ndị mmegide Kraịst.

Ana m ekpe ekpere ka ịnọgide, mana, enyi m nye ụdị akwụkwọ dị otu a,

okwu Chineke. Nke a, n'eziokwu, ka anyị kwesịrị ịlaghachikwuru.

Oge adịghịzi. Eziokwu n'ada ada.

Ọ na-emezi n'ihu anyị ugbua.

Aha m bụ Steven Andasọn, onyeụkọchukwu nke Fetful Baptist Chọọchị

na Tempre, Arizona. Chọọchị anyị bụ naanị Kịng Jems; ọtụtụ

mmadụ enweghị nghọta ihe mere. Mana nzube ihe nkiri a bụ

igosi ọdị iche dị na Baịbụl Kịng Jems

na vashọn ndịọzọ.

Aha m bụ Roja Jimenez onyeụkọchukwu nke Veriti Baptist Chọọchị

na Sacramento, Kalifonia, ihe mere m ji nwe obiụtọ isonye n'ihe

nkiri a bụ na okwu Chineke n'enwe ihe ịma aka buru ibu taa

nke n'anyị kwesịrị ikwụnyere Baịbụl ka anyị nwe ike

ịlụ ọgụ ime mmụọ

- Aha m bụ Dennis McCain. Abụ m onyeụkọchukwu nke Northside Baptist Chọọchị

na Modesto, Kalifonia. Ana m arụ ụkọchukwu ebe a kemgbe afọ iri na isi

ana m agbasa ọlụ oziọma dịka onye kụrụ mkpụrụ kemgbe

ihe ruru afọ iri anọ

ya mere onwere isiokwu anyị ji taa nke bụ nzube ekwensu maka ịgbanwe

Baịbụl. Ụfọdụ n'eche si, "ọbụ ezikwu na Kịng Jems nwere

ezi nsụgharị;mana edere ya dịka egwu, vashọn ndịọzọ

onyechaghị ihe achọrọ". Mana anọ m ebea

ịgwa gị n'ọdị omimi karịa ka ichere. Vashọn ndị ọhụrụ a

bụ ihe ekwensu tinyere iji mee ka okwu Chineke ghara ịdị ire. aga m egosi gị

na mgbanwe ndị a abụghị ihe aga eleghara anya, ha abụghị

ihe aga eleghara anya, maọbụ ihe enweghị isi. Ihe m n'ekwu bụ n'ọbụ mgbanwe doro anya.

Emere ya iji ghagbuo ozizi Baịbụl.

Baịbụl gwara anyị na Efesọs :, "Mgba anyị n'agba abụghị

nke anụ ahụ na ọbara, mana nke ọchịchịrị na ike,

ndị ọchịchị dị elu nke ụwa, ndị mmụọ ọjọọ

nọ n'ebe dị elu." Onwere ọtụtụ mmadụ ndị nwere ọtụtụ

nde na ijeri dọla ndị nwere ọchụchọ ka iwepụta

Baịbụl adịgboroja site n'ịkwalite ya, na site n'ime mgbasaozi maka ya,

ịkwalite ya site na ire ya n'ọdụ ahịa nke ga-edobe ya n'ihu maka ndị mmadụ inwe mmasị na ya

nke ahụ ga-egosi ndị mmadụ, "nke a bụ Baịbụl ikwesịrị ị na-agụ. Wepụ

Kịng Jems Baịbụl. Nweta nke ka dị ọhụrụ, ka mma, nke vashọn ya ka mma

ugbu a emeela m ọtụtụ nchọpụta maka vashọn kasị dịrị ebe niile taa.

nke a kasị dịrị ebe niile. Elere m ya na ọtụtụ

ndịọzọ ma chọpụta na ha niile dabara na Baịbụl ise ahụ. Nke mbụ

abụghị Baịbụl Kịng Jems. Ọbụ Niu Intaneshọnal

Vashọn:NIV. Nke abụọ bụ Kịng Jems. Nke atọ,

bụ Niu Livin Transleshọn. Nke anọ, Niu Kịng Jems, na nke ise

Inglish Standard Vashọn maọbụ ESV. Ndekọ ndịọzọ m lere

nke dịtụ iche n'usoro, mana ha nwere ha niile.

Ụfọdụ amaghị n'enwere, ọtụtụ narị nsụgharị, na

anyị enweghị ohere ile ha niile n'otu n'otu,

- ọga amagbu onwe ya ile anya naanị na ihe nduhie

nke kasị pụta ihe. NIV nwere amaokwu iri na isii adịghị ya na

Testament ọhụrụ. Ihe m n'ekwu bụ n'ọdịghị ya ma ọlị, tupu anyị

ekwuo maka puku amaokwu ndịọzọ agbanwere, mana iri na isii bụ ihe

adịghị ya kpamkpam. Matiu : - Matiu : - pụrụ. Ọlụ ndịozi : - amaokwu ndịa

pụrụ site na NIV, pụrụ site na ESV, pụrụ site na Niu Livin Transleshọn

- ha niile pụrụ

Ọlụ ndịozi :, Kịng Jem Baịbụl: "ka ha n'aga n'ụzọ,

ha zutere ebe mmiri nọ: ma onye onozi ahụ kwuru sị, lee mmiri;

Gịnị na-egbochi m ime baptizim. Ma Filip " ya bụ onye ziri ya oziọma -

"kwuru, ọbụrụ n'ikwere n'obi, gosi ya."

ya bụ, onye onozi bụ onye mmehie - sịrị, "gịnị ga-egbochi m,

ga-akwụsị m ime baptizm?" Filip, onye ziri ya oziọma

sịrị, "ọbụrụ n'iji obi gị niile kwere, gosi ya.

ma ya " - onye onozi ahụ - zara ma sị, ekwere m na Jizọs Kraịst

bụ nwa Chineke." Gịnị meziri onye onozi ahụ? azọpụtara ya.

N'ihi gịnị? ọbụrụ n'anyị ejiri ọnụ anyị kwuputa onyenweanyị Jizọs ma kwere

n'obi anyị na Chineke kpọlitere ya na ndị nwụrụ anwụ, aga azọpụta anyị.

Okweere n'obi ya, ma jiri ọnụ ya kwuputa. Azọpụtara ya

Ya mere gịnị ka ha mere? amaokwu

Ma ọgwara ụgbọ ịnyịnya ahụ ka ọkwụsị otu ebe: ha abụọ ewe rịdata

na mmriri. ya we mee ya baptizm."

amaokwu : Gịnị n'egbochi m ime baptizm?

amaokwu : ọbụrụhaala n'ikwere aga eme gị baptizm

Oji ọnụ ya kwuputa, jiri obi ya kwere

amaokwu : ha emee ya baptizm. Amen.

Gịnị ka Niu Intaneshọnal vashọn kwuru?

"ka ha n'aga n'ụzọ, ha rutere ebe mmiri nọ ma onye onozi ahụ sịrị

lee, mmiri. Gịnị ga-egbochi ime m baptizm?

Owee nye iwu ka akwụsị ụgbọ ịnyịnya. Filip na onye onozi ahụ

banye na mmiri. Filip wee mee ya baptizm." Ugbu a onwere ihe ịchọpụtara?

Ihe mere. Onwere ihe adịghị ya?

Amaghị m ma onwere ihe ịchọpụtara. Onweghị ihe dị na amaokwu .

Ya mere dịka Niu Intaneshọnal Vashọn, ha anaghị agazi nkeọma,

okwuru sị," Gịnị ga-akwụsị m ime baptizm".

Dịka NIV, onweghị! Ka anyị mee gị baptizm.

Kedu ihe adịghị ya? Kwere na Jizọs Kraịst!

Kedu ihe adịghị ya? Oziọma.

kedu ihe adịghị ya? Gịnị mere Baịbụl ndị a ji agba Jizọs Kraịst mgba?

Onweghị ihe nke ahụ pụtara nye m?

Mana ọ ga-adị. Ịma n'ọbụ ekwensu nọ n'azụ ihe ndị a?

Ọbụghị naanị n'owepuru amaokwu iri na isii site na NIV,

mana ha tinyere uche ha site n'idetu okwu ole na ole na amaokwu ndịọzọ, n'ekwu n'ikekwe ha adịghị

na ndekọ Baịbụl nke mbụ ya, n'emezi ka mmadụ n'arụ ụka n'okwu Chineke

amaokwu ndị dịka Mak :. "Gaanụ n'ụwa niile ma zie oziọma

nye ihe niile ekere eke." Amaokwu ndị dịka "Nna gbaghara ha, n'ihina ha amaghị

ihe ha n'eme."Ha ewepubeghị amaokwu ndị a, mana ha denyere ihe na ya iji

mee ka onye n'agụ ghọta ya dịka ihe enweghị ndabere, sị, nke a,

adịghị na ndekọ mbụ nke Baịbụl onweghị

ikike onwere ma ọlị."Anyị kwenyere na Jizọs bụ Chineke nke bịara n'anụ ahụ.

Nke a bụ ihe vashọn ndịọhụrụ agbanwere ma n'emegide ya.

Ka m gosi gị iheatụ ụfọdụ. Jọn :; " Ma enwere ihe atọ

nke n'agba ama n'eluigwe, nna, okwu na mmụọ nsọ,

ha niile bụ otu." Ebe ahụ ka anyị nwetara okwu ahụ bụ"atọ n'ime otu"

Atọ nọ n'ime otu

"Ha atọ bụ otu."

NIV n'aka nkeọzọ, kwuru naanị "ma onwere ihe atọ n'agba ama".

ọkpọghị nna, okwu na

mmụọ nsọ, ma okwughị na ha atọ bụ otu.

Lee ihe ha mere na Timoti :. Ebe ahụ gụrụ sị," N'enweghị ihe ịrụ ụka ọbụla

banyere iheomimi nke Chineke:" -Lee nke a - Chineke bịara

n'anụ ahụ, onye enyere ikike na mmụọ, onye ndịmmụọ ozi hụrụ,ziri oziọma

nye ndị mba ọzọ, kwere n'ụwa, ma bụrụ onye anabatara n'eluigwe n'ebube."

Ụwa kwenyere na Chineke, ọbụkwa Chineke ka anabatara

n'ebube, ọbụkwa ya ka emere ka ọghọọ anụ ahụ ma binyekwara anyị, ma

Baịbụl mere ka odoo anya na Timoti : na Jizọs Kraịst bụ Chineke

- na Timoti :, ọbụ akụkụ akwụkwọ nsọ nke m ga-achọ mgbe niile.

Ihe edere n'okpuru Niu Amerịkan Standad nke m nwere mgbe m n'agụ akwụkwọ ndị ụkọchukwu

ma mechaa na NIV, akụkụ akwụkwọ nsọ, ha ga-ekwu sị

na ihe edere n'okpuru ya, maọbụ ihe ndị ha n'ekwu, maọbụ ha n'ezi

site na NIV maọbụ na Niu Amerịkan Standad, ha n'ekwu n'enweghị

ihe dị iche n'ozizi iheọmụmụ ụka. Ometụtaghị nkwenkwe

n'ụzọ ọbụla. Mana enwere ọdị iche dị na "hos" na "Tios"

ọbụrụ n'iwere dịka "onye nọbu, 'hos' "ma hapụ "tios"

nke bụ Chineke, ọ ga-emebi ihe edere ede n'ihina ị ga-egosi

na Kraịst bụ Chineke, maọbụ nke bịara n'ụdị mmadụ. Mana na "Tios", onweghị ihe obi abụọ dị na ya

banyere ihe ebe ahụ kwuru. Ọbụ Chineke bịara n'ụdị mmadụ, ma

nọrọ n'ahụ nke Kraịst, nke ahụ bụ ihe n'akwali ndị mmadụ

iche banyere ịdị elu nke onyenweanyị Jizọs. - Ọdị mma.

- Iheama ọzọ gosiri na Jizọs Kraịst bụ Chineke bụ na Hibru :.

"Mana ọgwara nwa ahụ sị, oche eze , Chineke, nọ ruo mgbe ebighị ebi".

Mana gịnị ka Baịbụl kpọrọ nwa ya ebe ahụ?

Ọkpọrọ ya Chineke ebe ahụ. Okwuru sị, "N'ebe nwa ahụ...oche eze, Chineke, nọ ruo mgbe ebighị ebi

ebighị ebi". Gee NIV.

"Mana banyere nwa ahụ ka okwuru sị"...

Na nso a, mụ na onyeama Jehova n'ekwu okwu n'okporo tren - agara m

ka m kpọta nwunye m.Onyeama Jehova ahụ bidoro ịgụpụta

akwụkwọ edere site na Baịbụl, mana ahụrụ m Baịbụl Niu Wọld Transleshọn.

Mana asịrị m, "Niu Wọld Transleshọn osi na Grik"?

Ọsịrị, "Osi na Weskọt na Họt na Grik Niu Testament."

Ajụrụ m, "ozukwaranụ ezu?"

Ee, "ozuru."

Asịrị m ya,"Inweela Grik"? Ọzara, "E e."

Asịrị m, "gịnị ka ị ga-eme maọbụrụ Jehova gwara Jizọs okwu ma kpọọ

ya Chineke?" "Nke ahụ emeghị".

akpọtụụrụ m ya na Hibru :. "Nye nwa ahụ ka okwuru,

N'oche eze gị, Chineke, n'adịgide site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi

Obi dị ya ụtọ na nkwali m nyere ya, oweere akpa ya ma mechie ụzọ

esoro m ya pụọ ma nọgide n'agwa ya okwu. Mana mgbe m gụọrụ ya site na

na Niu Wọld Transleshọn mgbe emesịrị, agbanweela ya kpamkpam:

- mana na Kịng Jems, ịgaghị aghọtahie ya. Odoro anya n'ọbụghị naanị ya,

mana ha busoro ọmụmụ nke Kraịst agha site n'aka nwa agbọghọ n'amaghị nwoke. Gaa na Luk :

Baịbụl kwuru sị, "Maa Josef na nne ya nwere ihe iju anya n'ihe

ihe ekwuru banyere ya".

NIV, n'aka nkeọzọ, ya na ESV, na Niu Livin Transleshọn

kwuru, "Nna na nne nwatakịrị ahụ nwere ihe iju anya n'ihe ekwuru banyere ya"

Ya mere ebe ahụ ka anyị hụrụ na NIV na vashọn ọhụrụ ndị ahụ n'akpọ

Josef nna nke Jizọs Kraịst, ihe Baịbụl Kịng Jems,

gbalịrị ka ọghara ime.

Josef ọbụ nna Jizọs Kraịst? E e ọbụghị.

Ọbụ nna lekọtara Jizọs Kraịst. Aga m enyere gị ya.

Mana ọbụghị nna Jizọs Kraịst.

nke bụ na, mgbe emesịrị n'otu isiokwu ahụ Meri kpọrọ Josef nna Jizos

Mana ha kwuzikwara ya ozugbo. okwuru sị, "Mgbe ha hụrụ ya, ọtụrụ ya anya:

Mana nne ya gwara ya sị, nwa m, kedu k'isi meso m otu a,

lee nna gị, mana anọgidere m n'enwe obi ịlọ mmiri maka ya."

ya bụ n'ọkpọghị Josef dịka nna Jizos? Leenu ka osi

gbazie ya ozugbo. "ya wee gwa ha,

Gịnị mere unu n'achọ m? unu amaghị n'ekwesịrị m

ịnọ n'ọrụ nna m?" ọ na-ekwu, "lee, ana m

arụ ọrụ nna m mgbe m n'ezi oziọma banyere Chineke n'ihina Josef

abụghị nna m. Chineke nna bụ nna m."

Ndị kwere na NIV, kpuru isi. Ahụla m ya.

Gosi m ma kwuo, "lee? Lee ka Baịbụl kpọrọ

Josef nna Jizos E e ọbụ Meri n'akpọ Josef

nna Jizos mana agbọchiri ya ọnụ ozugbo. Ekwesịrị ime

ime NIV otu ahụ. Ekwesịrị idezigharị Niu Livin Transleshọn.

Ekwesịrị igbochi ESV n'ikwu, "Chere obere oge. Imetaghị ya.

Onye a abụghị nna Jizos. Nna Jizos bụ Chukwu nna."

Ikwuru sị, " ọdị mma, odị mfe ikwe nghọta. mana,

mgbanwe anaghị emetụta nkwenkwe."

Ndị a bụ nkwenkwe dị mkpa, ọ bụghị ya?

Kraịst dị elu, ọmụmụ nke nwaanyị amaghị nwoke.

Ọbụghị naanị ya;ha megidere ya tupu ọbịa. lee Kraịst

abịaghị na Jeruselem n'ihe eji enye anụ ụlọ nri Jizos abịaghị

n'ime afọ Meri, kama Jizos dịbu adị kemgbe

ma dịrịkwa. Ọbụ onye mbụ na onye ikpeazụ, bụrụkwa Alfa na Omega,

ọbụkwa mbido na ọgwụgwụ, ọbụkwa ihe kwesịrị onye dịka Jizọs.

Ọbụrụ na ekere ya eke, ọgaghị abụ Chineke.

Baịbụl kwuru na Maịka :, "mana gị, Betlehem Efrata,

gị kasị dịrị obere na puku nke Juda, mana

ebe ahụ ka onye ga-achị Izrel;ga-esi apụta, onye

ga-esi na gboo bilite," -lee nke a - site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.

Ya mere na Maịka :, Baịbụl gwara anyị na Jizọs Kraịst si na "mgbe ebighị ebi."

Nke a bụ okwu abụọ siri ike n'ihina ha kwuru okwu mgbe ebighị ebi

tupu ọbịbịa nke Kraịst Jizọs. Onweghị mmalite. Ekeghị ya eke.

Ọbụ Chineke n'ụdị mmadụ. ya na Chineke nọ na mbido, ọbụkwa Chineke. {Jọn :}

Ugbu a, mgbe ebighị ebi" pụtara ruo mgbe ebighị ebi; ọ ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi

ya mere " site na mgbe ebighị ebi" ga-abụ na mgbe ebighị ebi gara aga

maọbụ ihe si n'oge gara aga bịa, ihe

dịbu adị. Gee NIV ntị:

" Mana gị, Betlehem Efrata, ọbụ onye kasị dị ala na Juda,

n'ebe ịnọ ka a ga-esi nweta onye ga-achị Izrel, onye mmalite

ya bụ site n'oge gara aga."

Ugbu a gịnị bụ mmalite?

Ya bụ mgbe ihe malitere ịdị,ọbụghị ya?

mgbe ihe malitere, ya bụ mgbe ihe malitere

Lee, Jizọs obidoro n'otu mgbe?

E e, obidoro na mgbe ebighị ebi na Kịng Jems

Mana dịka NIV, onwere mbido.

Ọbụrụ na Jizọs Kraịst nwere mmalite, ọbụghị Chineke, n'ihina

ọnọbu ma dịrịkwa ma ọ ga-abịa, {Mkpughe :}

Chineke dịbu adị

Chineke abụghị onye ekere eke

mana nkea bụ ihe NIV mere nke ghasara ọtụtụ ihe:

- Aịzaya : kwuru sị: " Lee ka osi daa site

n'eluigwe, onye bụ Lusifa"...

- naanị otu ebe na Baịbụl niile ka okwu ahụ bụ "Lusifa dị na Baịbụl. Otu ebe.

Ebe a anyị tinyere aha ahụ bụ Setan, Kpọọ ya Lucifa,

ọbụrụ na anyị agagharịa ma jụọ ndị mmadụ, "onye bụ Lusifa?

Gịnị bụ Lucifa"? ha ga-ekwu "ọbụ Setan; ọbụ ekwensu."

Ịma onye Lucifa bụ?

- mmụọ ozi esi n'eluigwe chụdata, ekwensu

Setan

ọbụ Setan

- ọbụ ekwensu.

- ekwensu.

-ọbụ ekwensu.

- Setan.

- Setan.

- Ekwensu.

- Ekwensu

- Ekwensu.

- Ọdị mma, onye bụ Lucifa?

- Ekwensu.

Ọbụ ajụjụ dị mfe; amara m. ozuru oke.

- Setan. Ọbụ ya.

- Kedu ụzọ mụ na gị siri mara n'aha Setan bụ Lusifa

bụ n'ihina Aịzaya :

" Lee ka osi si n'eluigwe daa, gị Lusifa,"- ugbu a achọrọ m ka ịmata

n'onyere anyị aha n'utu aha - " Gị Lusifa, nwa chi ụtụtụ!"

Ya mere gịnị bụ utuaha Lusifa? "Nwa chi ụtụtụ", ọdị mma?

Mkpughe isi , amaokwu ; Kịng Jems vashọn kwuru nke a:

"Mụ Jizọs ezigala mmụọ ozi iji kwusaa ihe na chọọchị niile

Abụ m" - nke a bụ Jizọs n'ekwu - abụ m mkpọrọgwụ na nwa Devid,"

- Ọbụ Jizọs n'ekwu okwu a - "bụ kpakpando ụtụtụ."

Ịhụla ya ugbu a?

Gịnị ka Jizọs kpọrọ onwe ya? Kpakpando ụtụtụ.

Nke ahụ bụ aha otutu ya.

- ya mere ma Kịng Jems na NIV na Mkpughe : kwuru na

Jizọs bụ kpakpando ụtụtụ

- Gịnị ka NIV kpọrọ Lusifa isi n'eluigwe dapụ?

- Lee ka isi dapụ n'eluigwe, kpakpando ụtụtụ, chi nwa ọbụbọ!"

Kama ịbụ n'achụpụrụ Lusifa n'eluigwe dịka Aịzaya :, na NIV

esi n'eluigwe chụpụ Jizọs.

Lee ugbu a, Baịbụl agwala anyị na Lusifa maọbụ ekwensu ka achụpụrụ na

eluigwe maka ịchọ ka ọdịka Chineke, nke dị elu.

Lee, NIV mgbe ọgbasịrị ịdị elu nke Kraịst mgba

tupu ọbịa n'ụwa, mgbe ọgbasoro ya mgba n'ihi esi n'aka nwa agbọghọ amaghị nwoke, na

onweghị mmalite,onweghị, onweghị ọgwụgwụ, ọbụ Chineke nke bịara n'ụdị anụ ahụ,

ugbu a, ana ebo ye ebubo n'ọchọrọ iru ka nna ya. Ọbụ onye dị elu!

- Dịka NIV gị, Jizọs si n'eluigwe datuo, ọbụghị Lusifa!

-Ndị nọ n'azụ ihe edere na Vashọn a si n'ebe ekwensu nọ. Setan chọrọ

ịghagbu okwu dịka omere n'ogige Iden.

Anyị makwanụ aghụghọ ya niile. { Kọrint :)

Ịhụla n'okwu Chineke dị ike nke ukwu.

Baịbụl dere na Hibru :, "okwu Chineke dị nkọ,

ma sie ike, ma dị nkọ karịa, mma nwere ihu abụọ, n'amabanye na,

mkpụrụobi na mmụọ, na nkwonkwo na ụmị

ma nwe ike ịchọpụta ihe dị n'uche n'ime obi."

Ekwensu maara na omerie anyị, dịka ndị otu Kraịst, omeriela anyị,

-ihe mgbaru ọsọ ya bụ ịnapụ anyị ngwaọgụ anyị.

Lee ndekọ ihe mere eme. Mgbe ndị ajọ mmadụ chọrọ imeri ọha mmadụ buru ibu, ịmaara

ihe si na ya pụta? ha naara ndị ahụ ngwaọgụ ha

Lee ihe ndị ọchịchị chọrọ ka ịmara, "anyị chọrọ ka iwepụ ngwaọgụ gị

n'ihina anyị ga-echebe gị."

Ịmaara n'ọbụrụ na mmadụ chọrọ ịnara gị ngwaọgụ gị, ha achọghị

ichekwa gị;ha chọrọ na mgbe ọbụla ha bịakwutere gị,

ịgaghị enwe ike luso ha ọgụ.

Na ndị Sọviet Union guzobere mgbochi ngwaọgụ. Site na na

egburu nde ndị ekwerenyeghị ndị ọchịchị.

Na , Jamini guzobere mgbochi ngwaọgụ, ma napụ ọtụtụ ndị be ha ngwaọgụ.

Site na na , egburu ndị Juu dị nde , ha na ndịọzọ

Na Chaịna guzobere mgbochi ngwaọgụ, ma napụ ndị mmadụ ngwaọgụ.

Site na na ,

egburu nde bụ ndị ekwerenyeghị ndị ọchịchị na Chaịna.

Na , Uganda guzobere mgbochi ngwaọgụ, ma napụ ndị mmadụ ngwaọgụ.

Site na ruo - jide nke a - egburu ndịotu Kraịst ,

Na ,Kambodia guzobere mgbochi ngwaọgụ, ma napụ ndị mmadụ ngwaọgụ,

Site na na , egburu ndị Kambodia dị otu nde.

Ikwesịrị ịghọta nke a: onyeiro n'agbalị oge niile iwere ngwaọgụ gị

pụọ, ọbụghị iji chekwa gị, mana ka ịghara ichekwa onwe gị.

- Ndị obi ọjọọ n'agbalị ịnapụ ndị mmadụ ihe ga-eji chere onwe ha n'oge ọgụ

iji mee ha ohu.Ndị ọchịchị maara na ha napụ ndị mmadụ ngwaọgụ,

onweghị ihe ha ga-eji chekwa onwe ha na mkpagbu

- Kwuo gịnị? Ana akpagbu okwu Chineke taa?

Ee. Maka ọbụrụ n'ekwensu anapụ gị ihe

ga-emekpa ya ahụ, ị ga-eji ihe ahụ inwere mekpaa ya ahụ,

ọnapụ gị ngwaọgụ gị onwetela gị.

- Ekwensu ga-eme karịa ịnapụ gị mma gị nwere ihu abụọ

Baịbụl Kịng Jems n'aka gị ma nye gị obere mma

akpọrọ NIV,

were obere mma akpọrọ ESV, dochie ya

jirikwa obere mma akpọrọ Niu Kịng Jems dochie ya .

Ọchọghị ka onwee ihe anyị ji echekwa onwe anyị. Ọchọghị ka anyị lụso

ndị ọchịchị nke ọchịchịrị nke ụwa a ọgụ.

Tesalọnịka isi abụọ amaokwu nke atọ, ekwela ka mmadụ ọbụla duhie gị site na

ụzọ ọbụla: n'ihina ụbọchị ahụ agaghị abịa maọbụrụ n'enweghị ndapụ,

na mkpughe nke nwa nke ịlaniyi"

Ya mere Baịbụl gwara anyị nke ahụ

- tupu onye mmegide nke Kraịst ahụ abịa, tupu alaeze nke ụwa abịa,

tupu ụwa ọhụrụ nke ahaziri nkeọma abịa, aga enwe ọtụrụ ndị ga-adapụ.

Gịnị bụ ịdapụ? ikwugide Kraịst.

-ekwenyere m na mbipụta vashọn ọhụrụ ndị a bụ atụmatụ ekwensu

maka otu okpukpe n'ụwa, otu ọchịchị na ụwa ọhụrụ.

Baịbụl gwara anyị na tupu Kraịst abịa nke ugbo abụọ, a ga-enwe ndapụ dị egwu tupu Kraịst abịa nke

nke akpọrọ "apostasía". ndapụ nke dị egwu

abụọ bụ n'ihi ụgha, nke Baịbụl vashọn ndị ọhụrụ

n'ekpudo okwu Chineke ihu n'alaeze ma n'agbanwe okwu Chineke

n'ozizi nke Kraịst.

- Ihe m n'ekwu bụ na ha n'etinye ihe ekwesịghị na Baịbụl, nke na ndị mmadụ n'arụ

Baịbụl ụka, ha n'arụ Chineke ụka, n'ekwenyere n'ekeghị mmadụ eke.

Ha kwenyere n'ihe ndị a niile, n'eme ihe niile ịkwalite otu ụwa

nke nwere otu ọchịchị. N'ihi gịnị? N'ihi ọ na-akwado ịdapụ n'okwukwe

- nke n'oge ụfọdụ, ndị mmadụ n'akpọtụụrụ otu ụwa ọhụrụ

maọbụ otu okpukpe nke n'abịa, ha n'akpọ ya

ụwa ọhụrụ nke ahaziri nkeọma. Ọbụ ya? Onwere onye n'anụ banyere ihe a n'oge mbụ:

"Ụwa Ọhụrụ Ahaziri" nkeọma"?

- Ọbụ nnukwu ihe, ụwa ọhụrụ ahaziri nkeọma.

- ha ga-abanye n'ụlọ na nhazi iheọgụ, egbe eji alụ ọgụ dịkwa

- ọbụ ụwa ọhụrụ ahaziri nkeọma...

- anyị ga-enye ya nkwado n'ikwe ụwa dị otu ahụ

nke m chere n'onye ọbụla ga-achọ ịhụ.

Inwere obi ike na ụwa nke zuru oke ga-ekwe omume, site n'ihe ịhụrụla?

- ọbụrụ n' ọ ga-ekwe omume, nke bụ eziokwu, ọnọ n'ọrụ ...

ndị nọ na nkwekọrita a chọrọ ka ndị ọchịchị

n'uche ha ha chere na nkea bụ nke ga-eweta ya

- ya bụ ịhazi ihe niile, nke bụ

inwe ikike maka ihe niile n'eme n'ahịa?

inwe ikike n'ebe anyị niile nọ.

- Lee nke magburu onwe ya. Ịmaara na NIV ji okwu ahụ bụ "nhazi ọhụrụ"

maka ọbịbịa nke Kraịst?

Na Baịbụl Kịng Jems, Hibru : sịrị, " nke nọ naanị n'anụ na

mmanya n' nsacha ihe dị iche iche, n'ihe edere maka anụ ahụ, ka amanyere ha ime ruo

oge ndozi."

Ihea n'ekwu maka ihe mere n'oge gara aga, ọbụghị ya?

Oge ndozi n'ekwu maka ọbịbịa nke Jizos Kraịst.

Ugbu a ikwesịrị ịghọta ihe a nke kwuru maka ọbịbịa nke Kraịst

nke mbụ. Anyị anaghị ekwuzi maka anụ mmanya, nsacha dị iche iche,

n'ihe banyere anụ ahụ. Anyị anaghị emezi ihe ọbụla dị otu ahụ. N'ihi gịnị?n'ihina oge

ndozi eruola. Onyenweanyị Jizọs bịara.

- Gee NIV ntị:"Iwu ndị dị iche dị ire ruo oge

nhazi ọhụrụ ga'eru." Ọbụrụ n'ịgụọ amaokwu na NIV, oyie ka ọbụ

ihe a na-atụ anya ya n'ọdịnihu

Nhazo ọhụrụ abụghị ọbịbịa mbụ nke Kraịst, mana ọbịbịa nke abụọ

nke Kraịst bụ nke akpọrọ nhazi ọhụrụ.

Gud Niuz Transleshọn kwuru otu a:

Ihe a niile bụ iwu, nke dị ire ruo oge Chineke

ga-eweta nhazi ọhụrụ."

Niu Inglish Transleshọn kpọkwara ya nhazi ọhụrụ.

Baịbụl Kọmọn Inglish kpọrọ ya nhazi ọhụrụ

Baịbụl akasị ere na Amerịka

kpọrọ ọbịbịa nke Kraịst nhazi ọhụrụ.

- Ka m gwazienu gị. Onye ga-akpagbu Kraịst n'abịa, mgbe ọbịara ọ ga-abụ

oge maka nhazi ọhụrụ.

Mana ọbụghị ihe Hibru n'ekwu.

Onwere ọtụtụ ihe Baịbụl ọhụrụ mere iji metụ aka n'ụzọ ekwesịghị nye amụma banyere oge ikpeazụ

iji kwado ndị mmadụ ịnabata ndị ga-emegide Kraịst, iji kwado ndị mmadụ

nabata ihe banyere ụwa ọhụrụ a, iji kwado ndị mmadụ

ka agbọgbuo ha maka otu ọchịchị maka ụwa niile, otu okpukpe, otu ụwa maka ndị

n'emegide Kraịst, n'iji nweta akara nwa anụọhịa ahụ

- "Ụkọchukwu Jimenaz kwuru, isonyeere na mkparịta maka mmegide.

Ikwere na nhazi ụwa ọhụrụ"?

- Ichere n'ọbụ iberiibe iche n'onwere ndị n'arụ n'ụlọakụ na ndịọzọ

n'agbalị iwebata otu ọchịchị?

Amaghị m ma ịgụọla akwụkwọ Mkpughe, mana Baịbụl gwara anyị

ndị mmegide Kraịst ga-eweta otu ọchịchị.

Baịbụl gwara anyị na ndị mmegide Kraịst ga-eweta otu okpukpe.

Echeghị m n'ọbụ ihe siri ike ịma na ndị mmadụ n'ekwu,

"na ndị ụlọakụ n'eweta ụwa ọhụrụ

n'otu ọchịchị".

Ugbu a ha n'eche - ndị a n'echepụta ihe a - ha chere na,

"Ee, n'ọbụ naanị ndị n'alụ n'ụlọakụ; maọbụ ndị a."

Mana anyị maara na Baịbụl na ndị n'emegide Kraịst

n'ewebatakwa otu ihe ahụ.

Ọbụ ihe Baịbụl kwuru.

Site n'ogige Ide, emeekpala okwu Chineke ahụ.

Tupu edesịa Baịbụl,

okwu Chineke n'ezute mmekpe ahụ, ichere n'ọga adị iche taa?

Ọdịghị otu ahụ

Ikwesịrị ịghọta ihe a. Taa, a na-emegide okwu Chineke.

vashọn Baịbụl ọhụrụ dị iche na Kịng Jems.

Ọbụ ya mere ikwesịrị iji jụọ onwe gị: N'ihi gịnị?

Iji ghọta ihe dị iche ikwesịrị ịjụ banyere

Baịbụl.

Ebe a enwere ebe a na-edebe Baịbụl ebe a na Fonix nke nwere

ebe buru ibu a na-edebe Baịbụl ndị dị iche n'ụwa,

onye n'ahụ maka ya ga-enyere anyị aka ileba anya na

ọtụtụ Baịbụl ndị dịbu tupu Kịng Jems na Kịng Jems n'onwe ya.

Ọ ga-akọwara anyị ihe niile banyere mbido Kịng Jems

Ọ ga-ebido na Erasmus' Testament ọhụrụ nke Grik,

na Testus Reseptus nke mbụ ya,

gwakwa anyị ihe niile banyere Baịbụl oyibo niile

ruo na Kịng Jems.

Ka anyị bido na Erasmus.

Ihe ịhụrụ na tebụl a, ụkọchukwu, na nchịkọta, ndekọ ihe na

banyere Baịbụl Kịng Jems.

Ma cheta na ebipụtara Baịbụl Kịng Jems na onwekwara

echiche ndị mmadụ nwere nke bụ na eji oyibo mbụ dee ya.

Mana ọbụghị ya. Onwere oyibo ndịọzọ tupu

nke ịhụrụ ebe a bidoro na asụsụ Grik eji dee Baịbụl, dịka isi kwuo.

Testus Reseptus, nke Tesmus Rotadam mere

gbanwere ihe niile anyị maara maka okpukpe

dịkwa ka ndekọ ihe ndị mere eme.

Akpọrọ ya Erasmus nke Rotadam Grik/ Latin Testament ọhụrụ

Ya mere, ka anyị kpọọ Erasmus ihe ọbụ:

Onye kasị dịrị nkọ, nke nọ chịm. Jizọs n'onwe ya

bụ onye kasị dị nkọ dịịrịla ndụ. Solomon nọkwa ebe ahụ, mana

taa anyị hụrụ Erasmus dịka onye kasị. Mana sayensị, iheọmụmụ maka Chineke,

ozizi ndị ọkachamara n'ọdị elu na ha niile.

-Nke a bụ ndekọ Testus nke mbụ ya Reseptus ebe a?

- Testus Reseptus nke mbụ ya.

- Ọmagburu onwe ya.

- Biko lee ya anya.

Akwụkwọ elere anya n'ọbụ ya kasị dịrị mkpa n'akwụkwọ niile

ọbụ akwụkwọ eji malite nhazi

ọbụla nye ndị ekweghị na Chineke, ikwesịrị ịma n'ọbụ akwụkwọ kasị mkpa ebirila n'okpuru anyanwụ

Renaizance bidoro ebe a. Site n'akwụkwọ a,

ịhụla ka osi dị mkpa, iheọzọ omere bụ

ịkpata ọtụtụ nsogbu. Gịnị ka m n'ekwu?

Ọdịmma, ego kwụsịrị ịbanye na Rom ka osi agabu. Onwere ụlọ a na-arụ,

onwere onye n'edozi ime ụlọ nke amaara nkeọma nke akpọrọ k'ọbịa rụọ ọrụ

nke rụrụ ya. Ana m ekwu maka Vatịkan, Michaelangelo,

ụlọụka nke Sistine. Ego kwụsịrị ịbịa. Ụka bidozie tinye ihe ụfọdụ n'isi ndị mmadụ

n'ekwu, "ikwesịghị ịkuzi nke a. Ihe a abụghị

ihe zuru ezu ịkuzi",ọbụ eziokwu na Erasmus sịrị "anyị nwere nsogbu ebe a.

okwuru sị 'metanoia' ọbụghị akwụla ihe maka ịda iwu,

ya mere anyị ga-eleba anya n'ozizi a." Mana ndị n'agba ụgha mgba pụtara

n'akwụkwọ a. Kedu ihe ha bu n'uche?

ikwuputa iwe ha.

- na ndekọ a ị na-egosi m, Erasmus etinyela Grik nke mbụ

n'akụkụ ụka Latịn, nke mere n'ahụrụ ihe ndị megidere ibe ya.

na ha abụọ- -ọbụ eziokwu.

-Ọbụ eziokwu? ya ka oji gbanwee ọtụtụ ihe.

Ogosiri ihe anyị adịghị emeta nkeọma, ma gosi ka okwesịrị ịdị.

Mana ọsụgharịghị ya ka ogosi ihe ọ ga-abụ ma emesịa.

Nke ahụ ga-adị ruo na .

- Ya mere nke a bụ ihe abụọ n'emegide onwe ha.

Ihe niile ọ na-eme n'egosi ihe akaebe na

- n'ụka Latịn mebiri vashọn na Testus Grik nke mbụ

Reseptus, tinyere ya n'akụkụ akụkụ ka onye n'agụ ya

bụrụ onyeikpe.

- mana nkea bụ mgbọ, gbagburu ụka.

- Ọbụ ya.

Ihe a ịhụrụ ebe a bụ ihe anyị ma taa mbipụta mbụ nke Baịbụl Kọvadel

ihe bụ akaọrụ Wiliam Tindel. Dịka anyị ma,

Tindel bụ onye hibere oyibo anyị ji eme ihe taa. Ọbụkwa ya hibere

Baịbụl mbụ na oyibo nke asụgharịrị n'asụsụ mbụ eji dee Baịbụl

Tindel na England chọrọ ime ihe Luta n'eme na Jamini.

Ya wee zoo onwe ya site n'enyemaka ọba akwụkwọ Luta, akwụkwọ ndị dị otu a,

dị ebe a, na nke Erasmus nke dịbu, Tindel wepụtara

Testament ọhụrụ nke mbụ. Ọbụ akwụkwọ achụsoro karịa akwụkwọ ọzọ na ndekọ ihe mere eme na England.

Eze chọrọ ka agbaa ya ọkụ

- mgbe ahụ Katọlik ka jisi England ike .

Mgbe Tindel wepụtara Testament ọhụrụ ya na ,

Ọbụ akwụkwọ mara ụka Katọlik aka n'ihu

na Lọndọn mgbe ahụ.

Nke a bụ nnukwu ihe n'ihina Tindel, na ngwụcha

ndụ ya, tinyere nnukwu oge maka ịtụgharị site na Grik

maka Grik iwepụta akwụkwọ a.

- Testament ochie niile, onwere ndị emetaghị site

Hibru nke mbụ ya mgbe akwụkwọ a pụtara?

E e, n'ihina ejidere Tindel na .

- Ọbụ ya.

Ejidere ya ma dobe ya n'ime ụlọ ruo ụbọchị . N'ụtụtụ nke

Ọktoba ,, ewepụtara ya ma gbaa ya ọkụ. Mana n'oge a

Maịls Kọvadel mechara ihe Tindel bidoro.

Ihe masịkarịrị m n'ihe a edere ebe a

bụ na ihe akpọrọ Baịbụl Matiu. Ugbu a gịnị k'ọbụ?

Onweghị iheọzọ n'abụghị ihe emezurula.

-Ọbụ ya.

- Ugbu a cheta mgbe Tindel nwụrụ okwu ikpeazụ ya, mgbe ọ na-ekwu okwu n'olu dara ụda

na mbido ọsịrị, " Onyenweanyị, mepee anya onye ọchịchị nke England".

Gịnị mere n'ekpere ahụ?

Tindel Kaara ikwu ọtụtụ okwu.

Gịnị ka ị na-egbu oge ikwu "Onyenweanyị mepee anya onye

ọchịchị nke England"? Tindel maara na agbanyeghị ka isi si mebie Henry nke Asatọ, n'ihe

mere oji hapụ chọọchị nke Rom, England

ga-enwe nchekwa. Ọbụ otu ihe inwe ọdịmma chiri anya

n'ebe Jizọs nọ wetara. Ọbụkwa iheọzọ inwe mmekọrịta chiri anya n'ebe

onye chọrọ igbu gị ụtụtụ ọbụla nọ. Nke ahụ bụ nzube ha.

Mana n'ikpeazụ, Henry nke asatọ hapụrụ ka Baịbụl dịrị maka otu ihe:

ịgba alụkwaghị m.

ihe odide abụọ gbanwere England.

Gị na Jizọs nwere ike inwe mmekọrịta chiri anya

site n'akwụkwọ abụọ a.

-inwere onye ogbugbo nke ụka, n'abụghị

naanị Jizọs Kraịst ịbụ onye ogbugbo.

- ihe anyị n'akpọ ebe nkwuputa taa

"gbaghara m, nna, n'ihina emehiewo m. Oruola izu ụka abụọ

mmesịrị nkwuputa.

- nke a megidere ebe nkwuputa.

Owepụrụ ya kpamkpam. Onwezighị mkpa ọdị. ikwesighị inwe

mmadụ ịgwa gị ihe ntaramahụhụ gị bụ

bụ mmehie imere megide Chineke.

Ihe anyị nwere taa bụ ihe akpọrọ nnukwu Baịbụl maọbụ Baịbụl

nke Henri nke asatọ, onye ọchịchị nke England nyere ikike ka ọdịrị

Nke ahụ yiri ihe ọchị, icheta ọtụtụ ihe.

mbipụta nke sochiri nke ọrụ Erasmus nke onye mere ya bụ Beza.

ya na ọrụ ọzọ anyị maara nkeọma, nke a nọ ebe a

nke Stafanus mere. Ugbu a Stafanus dị mkpa n'ihina onyere anyị Grik

nke Giniva Baịbụl maọbụ nke ndị ndozi nke Jọn Kalvịn,

Wiliam Witingam, ndị a, ji okwu Grik sụgharịa nke

Baịbụl oyibo maara taa dịka Baịbụl Giniva.

Ugbu a amaara ya nkeọma n'ihina obu ụzọ nwee amaokwu. Ọdịmma, ọbụ ya mere

ọtụtụ ndị jiri mara Baịbụl Giniva nkeọma. Ọdịka ebe Jọn :

si bịa, ọdịmma, osi na ...

- Ha kewara ya na isi na amaokwu?

- isi niile nọ ya.

Ha kewara ya n'amaokwu. aghọtara m gị

- mgbe Henry gafesịrị, nwa ya bidoro chịwa. anyị maara ya taa dịka

Edwọd nke . Ọnwụrụ n'ezigbo oge. Ọchịrị naanị afọ anọ maọbụ ise.

Mana mgbe ahụ, ọhapụrụ akwụkwọ nsọ k'ejiri ya n'eme ihe. Mana

ọlụghị nwaanyị, ọmụtaghịkwa nwa, ya mere mgbe onweghị onye nnọchianya, onye ga-

ewere ọchịchị? Nwanne ya nwaanyị. onye ọbụla maara taa dịka Blọdi Meri. Anyị amaghị

ma enyere ya aha ahụ n'ihina ọ na-erikarị tomato vodka

na tabasco. Akpọrọ ya Blọdi Meri n'ihina oji aka ya gbuo

, ndị be ha. Nke a bụ nnukwu iheatụ. Ezinụlọ,

Onye ụkọchukwu, n'ọchịchị Blọdi Meri. Ebe a ka nne ise na nna ise, ha niile

ka agbara ọkụ n'osisi. N'ihi gịnị?

Ha kụziere ụmụ ha ekpere nke onyenweanyị na oyibo.

- Ọmagburu onwe ya.

- Owee gbaa ha niile ọkụ.

- N'ihi ịnụ ọkụ n'obi nke onwere maka ụka Katọlik, k'oji egbu ndị a.

- ndị mụrụ ụmụ n'akụziri ụmụ ha.

-Ọdị mma. Ha chọrọ k'ọbụrụ naanị ụka n'akụziri ha?

- Anyị erughị eru, ndị ụkọchukwu, ịkụziri ụmụ anyị.

- Agbara ha ọkụ n'ihi ịkụziri ụmụ ha ihe n'ụlọ.

Ọbụ ihe kpatara ya. N'ụzọ ọzọ, ọbụ ihe kpatara ya.

Ha chọrọ ka naanị ha n'achị

- Ọmagburu onwe ya.

Mgbe obidoro, ndị nwere obi ike kpebiri na anyị

ga-enupu isi. Kedu ihe bụ aha ha? Jọn Nos, Jọn Fos, Wiliam Witingam.

Ha gbapụrụ na England ma bidokwa rụba ọrụ na ihe odide nke ọhụrụ. Kedu ihe anyị n'akpọ

ihe odide a taa? Anyị n'akpọ ya Baịbụl Giniva.

- Ya mere okwuru okwu ebe a, onyeọzọ edeela ihe ebe a. "Baịbụl ezinụlọ".

Nke a dị mma. Ọbụ ihe ọbụ n'eziokwu: Baịbụl emere maka ezinụlọ nke mbụ

-Ọbụ ya.

Ihe anyị maara taa dịka Testus Reseptus, ọ ga-emepụta

ihe anyị maara dịka Baịbụl "maka ịkuzi ihe n'ụlọ" nke mbụ Baịbụl: Baịbụl Giniva.

-Ọbụ ya.

- Ọbụ akwụkwọ akasị erepu na Mayflawa

- Aghọtara m gị.

-Ọbụ Baịbụl juru na Jestaụn

Mgbe Blọdi Meri mechara arụ ahụ, onwere nwanne nwaanyị. Anyị maara aha ya

Kween Elizabet. Iji rite obi ndị mmadụ, onyere anyị

Baịbụl Bishọp. Ndị haziri nke a bụ ndị " Bishọp"

nke ndị ụkọchukwu mere.

- mana ha n'ewukwasị na mgbalị nke etinyere na Baịbụl Giniva

- Ha chọrọ ihe nwetụrụ ikike

- ọbụ ya.

- osi n'aka ndị inwere ntụkwasị obi ebe ha nọ

- ndị maara nke ha riri na Hibru na Grik, n'eziokwu ọbaghị ndị mmadụ n'obi.

Ọbụ ọrụ magburu onwe ya.

- n'otu ụzọ ọdabachaghị

- onweghị mgbe ọdabara.

- onwere ike Chineke maara na nke ka mma n'abịa.

- mana onweghị nwunye;onweghị ụmụ. Onye ga-anọchi

ya? Nwa nwanne nna ya si Skọtland. N'eziokwu anyị maara ya dịka Kịng Jems

nnukwu Baịbụl ahụ, nke dị ogologo nke ị na-ele anya ebe ahụ

ya bụ mbipụta mbụ nke Baịbụl Kịng Jems. mgbe otu afọ gasịrị, ha hapụrụ

ndịọzọ ka ha zụta ya ebe a na-ere akwụkwọ, ya ka iji n'aka

ya bụ mbipụta mbụ nke Testament ọhụrụ nke Kịng Jems.

- Omagburu onwe ya.

Ya mere mgbe anyị ruru , Kịng Jems weere oche ọchịchị. Kịng Jems nke isi

nke Skọtland. Ekwuru banyere ya mgbe obidoro chịwa dịka eze n'onwere nsụgharị ọhụrụ

nke ga-apụta n'akwụkwọ nsọ. Ihe mere oji dị otu ahụ

bụ n'onwere ọtụtụ ndị mmadụ ndị ji Baịbụl Giniva eme ihe, mana ha agaghị

ụka nke bụ Baịbụl Bishọp, ya mere enwere vashọn abụọ, ha abụọ

nwere otu ihe.

Baịbụl Giniva nwere nsogbu; Bishọps Baịbụl nwere nsogbu,

Ha sị ka anyị were oge mee ya k'ọdị mma.

Ha nwere ndị maara akwụkwọ nkeọma ha jikọrọ aka sị n'anyị anaghị agbalị

ịgbanwe vashọn adịghị mma.

Anyị n'enwe ọganihu doro anya. Ihe m n'ekwu bụ na ha dị mma

nsụgharị, Giniva Baịbụl dị mma; nsụgharị Bishọps Baịbụl dị mma;

Anyị ga-eme ka ozuo oke ma mee ka ọbanye.

ya mere bido na ruo asụgharịrị KJV site n'aka mmadụ

ndị maara nke ha riiri ndị nọkwa mgbe ahụ. iji nye gị iheatụ: otu onye,

Lanselọt Andrus, bụ onye ma nke oriri na Latịn, Grik, Hibru, Kaldian, Siriak

Arabik, ma n'asụkwa asụsụ iri na ise ndịọzọ eji emekarị ihe ugbu a, ọbụ otu onye n'ime mmadụ

ndị sụgharịrị Baịbụl Kịng Jems ihe ruru afọ asaa.

- Ya mere onwere ndị bụ ndị ọkammuta na Arabik. Onwekwara ndị

bụkwa ọkammuta na Grik na Hibru. Onwekwara ndị nke Aramaịk ha bụcha ndị maara nke ha riri

n'iheọmụma, ha niile. iheọmụma ha nwere na Baịbụl gbasara agbasa.

Ha nwere nkwenkwe ndịọzọ na mmụta dị iche iche n'ihe banyere ọmụmụ banyere Chineke

nke mere ha ji dị iche n'ebe ndịọzọ so mee nsụgharị a nọ.

Ihe ha mere bụ ike onwe ha ụzọ isii.

Mmadụ isii ndị a sụgharịrị akwụkwọ isii nke Baịbụl na ndịọzọ. Ya mere mgbe ha

mere nke , ha tụlekọtara ndịọzọ ọnụ, otu isii a niile mere

nke a. Ha họọrọ otu onyeisiala nke ga-elebara otu isii ndị a anya.

ihe mere bụ n'elebara ibe akwụkwọ nsọ niile anya ugbo iri na ise.

na ngwụcha: ha niile bịara na nkwekọrita n'ihe

ha niile ji mee ihe nke nwere ndaba, nke a bụ

ihe okwuru. Nke a bụ ihe ọpụtara,

ọbụrụgodi n'enwere nke megidere ibe ya bụ ihe ichere.

- N'afọ , onye ọchịchị sịrị, "ọdịmma, aga m ahazi otu kọmitii n'agbanyeghị oge ọ ga-ewe

unu ga-eji iwu abụọ mee ihe:

Testament ochie, ga-enweta nsụgharị site na Hibru, Testament ọhụrụ ga-enweta nsụgharị site na

Grik, aga m eweta ihe niile ọ ga-ewe iji hụ na nke a

gara k'osi kwesị." Ya mere Hibru nke bụ ya mgbe ahụ

bụ nke ndị ọkachamara Grik nke oge ahụ nwere ike inyefe, na , ewere mmadụ n'ọrụ. Ha

gara rụọ ọrụ afọ asaa ma wepụta ihe anyị maara taa dịka

ihe mere eme banyere mmadụ: mbipụta mbụ ya, mbipụta mbụ ya, mbipụta

ihe odide nke Kịng Jems. Owere ha afọ asaa.

Ha rụrụ ọrụ dị ịtụnanya. Kịng Jems nke mụ na gị n'agụ taa

si na ndezigharị nke , mana ihe a bụ ebe ihe odide ahụ gbadoro ụkwụ

ihe a bụ ihe si na ya pụta. Na , onyere anyi maara taa dịka

Testament ọhụrụ nke Kịng Jems eburu ụzọ jide n'aka.

- Nke a bụ ihe eji n'aka.

-Ọbụ ihe eji n'aka.

- Testament ọhụrụ eji n'aka

- Onyeisiala kwuru sị, ọbụrụ n'ị ga azụtanwu ya ịpụrụ inwe ya. Ebe niile a na-ere akwụkwọ na Lọndọn

rere ya, ma si otu ahụ gazue ebe niile.

Nke na ọbụrụla akwụkwọ akarala repu na akụkọ ihe mere eme

nke mmadụ. Onwebeghị akwụkwọ ọzọ erere karịa ya, maọbụ nke ga-eru ka ya.

Mgbe anyị lere vashọn Baịbụl niile dugara na mbipụta Kịng Jems: Tindel,

Matiu, Kọvadel, Great Baịbụl, Giniva Baịbụl, ha niile

sonyere Kịng Jems. haniile n'ekwu otu ihe ahụ

Kịng Jems n'ekwu. Kịng Jems bụ nchịkọta Baịbụl nke ndịọzọ sonyeere

Ya mere ọbụrụ na Baịbụl Kịng Jems na Baịbụl oyibo ndịọzọ nwere otu olu

ya na Baịbụl ndịọzọ sochiri ya, keduzi ihe mere Baịbụl ọhụrụ ndị a ji dị iche

Dọkịta Jems Waịt bụ onye jụrụ ọtụtụ ajụjụ ndị metụtara Kịng Jems naanị

odere akwụkwọ ndị megidere naanị Kịng Jems.

Oweere onwe ya ịbụ onye mere ka amara ihe ekwesịrị iji rụọ ụka ihe mere naanị Kịng Jems ji ọdịghị mma,

ya mere anyị ga-agwa ya okwu ma mara ebe ịrụ ụka ya gbadoro ụkwụ.

- Jems? anyị nwere ndịọbịa.

- Ọdịmma. Kedu?

Dọkịta Jems Waịt, imeela maka okwu ịbịara gwa anyị taa,

- Anyị nwere obiụtọ ịnọnyere gị.

- Inwere ike inye m Kodes Sinaiticus niile,

na Kodes B niile?

- Ma Sinaiticus na Vatikanus bụ ihe ejikarị mee ihe na Kịng Jems

n'ihina ọbụ ihe nyere aka na

iwepụta Testament n'abụghị Testus Reseptus

- ụmụ nwoke abụọ aha ha bụ Westkọt na Họt tinyere aka ma wepụta ihe odide

nke gbadoro ụkwụ na akwụkwọ amaara dịka Sanaitikus maọbụ "Kodes Alef" na

Vaticanus maọbụ " Kọdes B". Akwụkwọ abụọ ka Westkọt na Họt

kwuru na ha ka dịrị ochie ma kwesị ka atụkwasị ya obi karịa ihe ndekọ Grik ndịọzọ

nke Testus Reseptus ji mee ihe.

Baịbụl ọhụrụ a bụ nke si na ebe nchekwa ihe ndị ọhụrụ na

ihe ọmụmụ nke achọpụtara. Ihe m n'ekwu bụ ndị mmadụ na ndị kwalitere

Baịbụl ọhụrụ ndị a ga-agwa gị, " Ee, ndị bipụtara ndị ọhụrụ ndị a nwere

ihe ha ga-eji mee ya taa. Ha nwere akwụkwọ adịghị

mgbe ahụ ndị sụgharịrị Kịng Jems. Ọbụ ya mere Baịbụl ndị ọhụrụ ji ka mma",

Ka ha n'ekwu. Mana ihe mere ha ji ekwu ya bụ n'akwụkwọ nke

Baịbụl ndị ọhụrụ a si na NIV na ndịọzọ bụ nchọpụta ọhụrụ ndị nwere ihe ha gosiri

n'eliri ha ọtụtụ afọ gara aga. Ugbu a ka m jụọ gị ihe a.Ikwenyere

n'eliri ya ọtụtụ afọ gara aga?

[nzụkọ] E e.

- ihe m n'ajụ bụ na ichere na Chineke ga-ahapụ ndị nke ya ka jiri

Baịbụl adịgboroja n'eme ihe ọtụtụ naarị afọ, ma na mberede

n'afọ ndị anyị ewee chọta akwụkwọ nke bụ ya?

Amamihe adịghị ya.

Ihe m n'ekwu bụ na Chineke kwere nkwa ichekwa okwu ya ruo ọgbọ niile, mana ha

kwenyesiri ike n'eliri okwu Chineke n'otu ebe

nke n'afọ ndị ahụ niile onye ọbụla n'agụ na ekwusa ma kwere

n'onwere ihe dị njọ ma kelee Chineke maka ndị chekwara ya n'afọ ndị

ma gwuputa akwụkwọ ndị a, ezigbo okwu Chineke nke eliri

n'afọ ndị a nile. Lee anya, ọbụrụ na Chineke weere ọtụtụ afọ ma gbalịa iwetara anyị

okwu ya site n'aka ndị amụma na ndị nsọ ndị kwuru dịka

mmụọ nsọ mere ka ha kwuo n'ọtụtụ naarị afọ, ee, ọtụtụ puku afọ,

ma kwe ka elie ya.

E e, ndị a egwuputara n'ikpeazụ, ndị ọhụrụ a, ndị kasị mma,

bụ wayo. Ha nwere aha dịka Kodes Vatikanus. Ugbu a, Hm, gịnị ka

nke ahụ chetaara gị? "Kodes Vatikanus".

- N'ihina ọbụ na Vatikan ka enwetara ya maọbụ onwere ihe jikọrọ ya na Vatikan,

ahụrụ m ya dịka ihe a ga-ebido nyobe enyobe.

- Ọdị mma.

- Enwere , ihe ndị enwetara na Grik, n'akụkụ

Testament ọhụrụ ndị dị maka iji ya mụọ ihe.

- Ọmagburu onwe ya.

- n'ime ha kasị pụta ihe nke ndị mere nsụgharị ahụ

nke nọ n'azụ Baịbụl Kịng Jems.

Ọbụ naanị pasent nke akwụkwọ dị adị,

ebe Baịbụl Kịng Jems ji pasent . nke mkpụrụokwu dị , nke ha mere nsụgharị site na ya.

Ọbụ ya k'eji kpọọ ya ndekọ nke kasị dịrị ire. ikwesịkwara

ịmara na - echeghị m n'ekwuru maka ya mgbe mgbe - n'akwụkwọ nsọ

site na Sinaitikus nakwa Vatikanus, enwere ihe karịrị ,

ihe dị iche. Kedu ka anyị g'esi mara nke ka mma maọbụ nke ka bụrụ eziokwu

n'abụghị ma akụkụ ndịọzọ onyere aka nye nkwado

eji mee ihe?Mana enwere m akwụkwọ abụọ, A na B, ndị n'aghọtahie onwe ha n'ihe

gbasara okwu Chineke n'ebe dị ,. Kedu ka m ga-esi mara nke m ga-atụkwasị obi? Ya mere aga m

atụkwasị obi n'ebe ka buo ibu.

nke nyere anyị Testus Reseptus

- ọbụrụ n'anyị ahụta ihe eliri n'ala nke kwuru ihe dị iche

n'ihe anyị nwetara, ndekọ ahụ enwetara, Testus Reseptus, nke ịmaara, na

na Baịbụl nke ndị mmadụ jirila mee ihe ọtụtụ afọ, nke ahụ ga-abụ wayo.

Agaghị akpọ ya okwu Chineke maọbụrụ n'ọbụghị Chineke chekwara ya. Ha na

agbahapụ puku Baịbụl n'asụsụ niile dị iche iche ndị n'ekwu

otu ihe ahụ. Kama nke ahụ ha ga-achọ iji Kodes Vatikanus mee ihe, Kodes

Sinaitikus, n'ihina ha ka mee ochie. Ọdị mma

na ha kara dịrị ochie apụtaghị na ha dị mma. Ọpụtaghị na ha

bụ adịgboroja. Lee , Pọl gwara anyị na Kọrint na ndị mmadụ

n'agwagbu okwu Chineke ọbụnadị n'oge ya. Na Tesalọnịka ha

n'ede ihe abụghị eziokwu n'aha Pọl.

Na Mkpughe , Chineke n'adọ aka na ntị ka ndị mmadụ ghara ịnwa

itinye ihe ọbụla n'okwu Chineke. Mana nke ahụ n'emezi Ugbu a. Ya mere

n'inwetara akwụkwọ nke gosiri na site na afọ mgbe Kraịst lasịrị, ewo,

onweghị ka ọ ga-esi metụ ya, ọbụghị ya? Ọbụ eziokwu.

Onwere ọtụtụ, dịka Baịbụl si gwa anyị, ndị gwagburu okwu Chineke.

Ọbụghị ole na ole, kama ọtụtụ.

- Akwụkwọ abụọ ndị a anọghị onwe ha.

- Ọbụ ya.

Ma taa na mbipụta Nestle Allen th , UBS dezigharịrị

ọtụtụ ihe n'ebe ụfọdụ, ọbụghị maka Sinaitikus na Vatikanus ekwenyekọghị,

ọbụ eziokwu na ha n'anọkọkarị ha anaghị ekwekọta n'ihe banyere

papịrị. Westkọt na Họt bu ihe n'obi megide Aleph na B.

Mana ha n'arụkọ ọrụ tupu papịrị.

Ihe ọbụla dị tupu papịrị adịzighị mkpa taa.

- Ejizighị ye eme ihe n'ihi nchọpụta ụfọdụ emere na akwụkwọ ndekọ?

Nchọpụta nke papịrị, nke si Ijipt

n'ebe ndịọzọ dị iche iche...

Alexandrịa bụ nnukwu obodo na Ijipt. Ijipt bụ mba nke dị na Baịbụl nke

eji ihe ọjọọ maara. dịka iheatụ, na

Mkpughe :, Baịbụl gụrụ sị, "Ozu ha ga-anọ na

n'ebe dị iche iche na nnukwu obodo, nke akpọrọ n'ime mmụọ Sọdọm na Ijipt,

ebe egburu onyenweanyị." Ya mere mgbe ọbụla Chineke chọrọ iji

Baịbụl akọwa obi ọjọọ, ọnọchiri anya ihe adịghị mma,

Oji ijipt mee ka nke ahụ pụta ihie. Eji Ijipt mee ihe nnọchianya nke

obiọjọọ na amaghị Chineke.

-Ọgụgụ nke akwụkwọ ndị ebu ụzọ dee, P, P,

enyochaala ma gosi n'ihe ndị edere na Sinaitikus

na Vatikanus enweghị nkwekọrita. Ihe m n'ekwu bụ na enwere echiche mmadụ nke juru ebe niile ugbu a

nke ndịụka Katọlik chepụtara n'onwe ha ma ndịọzọ dị otu a

nke juputara na iberiibe.

-Ikwesighị iche na NIV bụ Baịbụl ndị Katọlik ji eme ihe, ha ga-agwa gị,

"eziokwu, eji ya ezi oziọma;ọbụ maka ndị Baptist." Mana ịmaara? n'aga m egosi

gị ihe niile ndị Katọlik kweere ma ndị bilitere n'ihina osi ebe

ndị Katọlik nọ were bịa. Ewepụla Ọlụ ndị ozi : na vashọn Baịbụl ndị ọhụrụ

n'ihina omegidere ime ụmụaka baptizim.

Ọbụ ya ka anyị ejighị eme ụmụaka Baptizim. Ịmaara ihe kpatara ya? N'ihina dịka

Baịbụl si jụọ, gịnị ga-egbochi m ịbụ onye emere Baptizim. Ị ga-ekwere,

ma bụrụ onye emere baptizim. Nwa amụrụ ọhụrụ agaghị ekwere. Ewepubeghị ya ma ọlị n'onye eruzighị eru.

Mana ọbụrụ na nwatakịrị anwụọ, ha n'aga eluigwe, Mana onye Katọlik ga-agụ ya ma kwuo, si,

" ọdị mma ime ụmụaka baptizim. Gaa n'ihu. Gịnị ga-egbochim ime baptizim?"

" Onweghị. Ka anyị mee ya Baptizim." Onweghị ihe kwesịrị igbochi gị ime

baptizim. Ọbụ ikwere. Ọdịghị na Baịbụl gị.

Ndị Katọlik n'akụzi na Meri ka bụ nwa agbọghọ n'amaghị nwoke

mgbe niile ọdị ndụ. Mana anyị maara na Meri bụ nwagbọghọ amaghị nwoke mgbe

ọmụrụ Jizọs, mana Baịbụl mere ka odo anya na mgbe nke ahụ gasịrị, ọmụrụ ụmụ

ndịọzọ. Nke n'agụpụtara aha ụmụnne Jizọs: Jems, Joses

Judas, na Saịmon. Egosiri aha ụmụnne ya , ma kwuo sị,

"ụmụnne ya ndị nwaanyị, ọbụ ha niile anọghị ebe a". Ya mere Jizọs nwere ụmụnne ruru asaa,

maọbụ karịa. Nke a bụ ihe gosiri ya na Matiu :. " Mgbe ahụ

Josef si n'ụra bilie mere dịka mmụọ ozi si gwa ya

ma kpọrọ nwunye ya: ma ya na ya enweghị mmekọahụ ruo mgbe

ọmụrụ nwa mbụ ya: ewe kpọọ aha ya JIZỌS." Ya mere okwughị na

ya na ya enweghị mmekọ ahụ. Kama ha enweghị mmekọ ahụ ruo mgbe ọmụsịrị nwa

Okwukwara na amaokwu nke na NIV, "Na ya na ya

abanyeghị n'alụmdi na nwunye ruo mgbe ọmụrụ Jizọs."

Gịnị bụ ihe adịghị ya?"Nwa mbụ".

Ọbụrụ na Jizọs bụ nwa mbụ nke Meri, nke ahụ gosiri n'enwere nke abụọ.

Mana NIV wepuru ya, ka iwe kwuo sị, ịmaara, n'ọbụ naanị otu nwa

ka onwere. Ozizi ọzọ nke ụka Katọlik nke nwere nkwado na

na NIV bụ nke mmadụ iti onwe ya ihe. Ịnụrụ ihe m kwuru nkeọma.

Mmadụ imekpa onwe ya ahụ maọbụ iti onwe ya ihe.

Ugbu a, enyi onye Katọlik ịmaara na Unaịted Steet nwere ike

ọnaghị eti onwe ya ihe. Mana akụkọ ihe mere eme nke Katọlik

n'egosi n'akụziere ndị mmadụ iti onwe ha ihe, ọdịmma? Nke bụ eziokwu bụ na mgbe

Henri nke Asatọ mere ka Katọlik nwụọ na England ma chụpụ

ya na England, onyekwara iwu ka onye ọbụla kwụsị iti onwe ya ihe

ọbụnadị taa na Filipin, ndị siri ike na ụka Katọlik

n'eti onwe ha ihe taa na . Ha n'akpọgide onwe ha n'obe;

n'eti onwe ha ihe; n'egbegharị n'ala ruo mgbe ikpere ha ga-ebido gbawa ọbara.

Ana m ekwu na ha n'eme onwe ha ihe a. Leenu ihe Baịbụl kwuru na

Kọrint :. "Mana edobere m ahụ m, ma mee ya k'ọnọrọ n'okpuru m: ọbụghị otu ahụ

ka osinadị, mgbe m ziri ndịọzọ oziọma, aga m abụ onye achụpụrụ achụpụ."

NIV sịrị" Ana m etiputa ahụ m ọnya". Vashọn ndịọhụrụ

kwuo ihe dịka, ana m eti onwe m ihe..."

- Butuo n'okpuru.

- E e ha anaghị asị "butuo". Ha sị "etiri m".

- E e, ọbụ ihe NET kwuru.

- Ọdịmma. Mana ana m agwa gị ihe NIV kwuru, "Ana m eti ahụ m ihe". Mbipụta nke kwuru

maka NIV sị, "Ana m eti onwe m ihe".

" Ana m etiputa ahụ m ọnya".

Echela n'aga m ekwuchitere NIV

- Ọdị mma. Ọbụ nsụgharị akasị ere na Amerịka na .

Ekwetaghị m.

- Elere m anya n'ebe ndịọzọ. Echere m na ESV...

- ọbụ #.

- Ọdị mma, ọbụrụ n'itinyere...

- ESV b#. Emekwara m ọtụtụ nnyocha na ya.

- Ọbụrụ n'itinye okpukpe ndịọzọ, onwere ike.

- ya mere kọrịnt :, ịgaghị ekwuchitere NIV ọnụ n'ihe gbasara"mmadụ iti onwe ya ihe"?

- E e.

N'ihina ọbụ ndịụka Katọlik k'eji ya mara. Ihe m n'ekwu bụ n'ọbụ chọọchị ndị Katọlik. Ka chi bọọ!

- E e, emela... Ọbụghị ebe osi bịa.

Cheretụ obere oge. Ị na-ekwu

na ndịụka Katọlik anaghị eti onwe ha ihe ruo taa?

They don't practice self-flagellation? Are you going to say that Henry VIII... Ha anaghị eme apịa onwe ha ihe? ị ga-ekwu na Henri nke asatọ ...

- Ụfọdụ mere otu ahụ; ụfọdụ anaghị abịazi ofufe nro.

Ha agaghị n'apịa onwe ha ihe.

- Kedu maka na ndekọ ihe mere eme? Kedu maka England mgbe Henri nke asatọ

chụpụrụ ndị Katọlik ma mee mmadụ iti onwe ya ihe, ihe iwu akwadoghị afọ ahụ?

- Mana Sreven, kedu ihe nke ahụ na ndị tụgharịrị NIV nwekọrọ?

Ịhụla, n'ihina Rom ebebuola ya n'ge gara aga

apụtaghị n'ọbụ k'esi chọọ ya.

- Ihe m n'ekwu bụ na Setan bụ Setan, Ọdịmma? Ọbụkwa otu Setan ahụ nke mere

ndị mmadụ ka ha n'eti onwe ha ihe n'oge gara aga ka bụkwa Setan ahụ ruo taa nke tinyere

NIV ka ha n'eti onwe ha ihe. Ọbụ ebe ahụ ka m si nweta ihe m n'ekwu.

- Ịmaara na dịka NIV si dee ya, odoro anya n'ihe ọ na-ekwu bụ

ihe ịma atụ.

- Ọdịmma, Vashọn Aplịfaịd. Amaghị m maka gị mana Vashọn Amplịfaịad

nyere m olu dara ụda. Enwetachaghị m ya. Mana gee ntị

n'ihe Vashọn Amplịfaịad n'ekwu:" ma [dịka onye oti ọkpọ] ana m etiputa onwe m ọnya". Ugbu a ka m jụọ gị

"ịhụtụla onye n'eti ọkpọ mbụ nke n'eti onwe ya ihe? Ahụbeghị m.

Baịbụl Kọmọn Inglish mere ya k'ọdị mfe nghọta nye gị, n'ihina

omere ka inwee mmasị n'ebe vashọn ndịọhụrụ, n'ihina

ha anaghị esi ike nghọta?"Kama ana m eti onwe m ihe n'ahụ niile ma n'eme ya k'ọbụrụ ohu".

Lee, mmadụ iti onwe ya ihe abụghị ozizi Baịbụl. Ikwuru sị, ọdịmma,

Ihe obu n'uche bụ ihe nnọchianya.

Ya mere kedu maka ndị a n'eti onwe ha ihe?

Ọbụ ozizi edoghị anya, enyi m. Ekweghị m ya.

Baịbụl kwuru na Matiu :, " mana mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwula okwu nkwukwasị efu, dịka

ndị mbaọzọ n'eme: n'ihina ana anụ olu ha site n'ikwu ọtụtụ okwu."

Ya mere ozizi Baịbụl abụghị naani ikwukwasị okwu

na'eche n'anyị kwuo otu ihe ugboro ugboro, Chineke ga-anụ

olu ya, karịa mgbe okwuru ya otu ugbo.

Gịnị bụ ikwughachi okwu? ikwu otu ihe ugbo abụọ, maọbụ atọ, maọbụ ise.

Ọ na asị lee, ejile okwu nkwukwasị efu dịka ndị mbaọzọ n'eme ihe. Ọdịmma,

NIV n'aka nkeọzọ - na vashọn ndịọhụrụ mere

mgbanwe na ndị a. - " mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwula ọtụtụ okwu ka ndị amaghị Chineke, n'ihina ochere

n'aga anụ olu ha n'ihi ikwu ọtụtụ okwu."

"Ikwu ọtụtụ okwu abaghị n'ihe "pụtara ikwu okwu abaghị n'ihe,

n'ekwu ya, n'ekwu ya, n'abụghị ime mkpọtụ. Ọbụghị ikwu okwu nkwukwasị efu.

Ọbụrụ n'ịgwa onye Katọlik sị, "ị na-ekpeghachi ekpere 'onyenweanyị' ikpeburu na mbụ

agaghị anụ olu gị n'ihi

ikwu ọtụtụ okwu. Nke ahụ bụ okwu nkwukwasị efu. Ikwesịrị ikwu nke ahụ

otu ugbo n'ekwughị ugboro

ugboro". Ịmaara na Matiu : kwadoro ya, mana ọbụrụ na m sị

ha, "Bịa unu emezila mkpọtụ ka ndị mbaọzọ," ha ga-asị, "ọdịmma

nke abụghị ime mkpọtụ. Ha ga-asị, " Ekpere nke onyenweanyị bụ okwu Chineke."

N'ihina ọbụ okwu Chineke, ọdịmma? agaghị n'ekwukwasị ya ugboro ugboro

n'ụzọ n'enweghị isi nye Chineke, mana ụka Katọlik kụziri okwu nkwukwasị efu,

mana emetụla ya aka.

Ọbụghị naani nke ahụ, ndịụka Katọlik nwere ozizi siri ike

nke ikwuputa mmehie nye onye ụkọchukwu. Ha ga-eduga gi na Jem :, Baịbụl ndịụka Katọlik

nwere ihe edere n'etiti ibe akwụkwọ ya nke kwuru, amaokwu a n'agwa gị ka

ikwuputa mmehie gị n'ebe onye ụkọchukwu nọ. Okwuru dịka iheatụ, na Dowe Remes

Katọlik Baịbụl na ndepụta ihe. N'ihe okwuru bụ. Jems :; Kwuputa nsogbu gị

n'ebe ndịọzọ nọ ma n'ekpere ndịọzọ ekpere ka ha we dị ike.

Ekpere nke onye eziomume n'enwe nnukwu ihe ọ na-arụpụta." Ugbu a gee ntị

n'ihe NIV na vashọn ndịọhụrụ gbanwere ya ka ọbụrụ: " Ya mere kwuputanụ

mmehie unu nye ndịọzọ ma n'ekpenu ekpere ka unu we dị ike.

Ekpere nke onye eziomume dị ike ma n'arụ ọrụ." Nke ahụ bụ ihe NIV kwuru.

Mana ikwuru, " ọdịmma, ha bụ otu ihe." Mana ha abụghị.

Nke mbụ, ịlaghachi azụ n'asụsụ mbụ, ịlaghachi azụ

k'esi dee ya n' Grik, okwu ahụ bụ "nsogbu"; ọbụghị "mmehie".

- Na Testus Reseptus, oji okwu ahụ bụ nsogbu , "paraptomata",

nke si na "paraptoma," nke pụtara "nsogbu". Ana m eche na mgbe ụfọdụ,

mgbe ha gụọrọ ihe abụghị ya ebe ahụ, ha n'etinye oge ha n'ikwuputa

mmehie ha nye mmadụ, kama nye Chineke, n'ihina " ọbụrụ n'anyị ekwuputa mmehie anyị,

ọ na-ekwesị ntụkwasị obi, ma gbaghara anyị, ma hichaa anyị

na mmehie anyị", mana mgbe m kwuputara nsogbu m nye gị, mgbe m kwuru sị, "Adịghị

ike ebe a na ndụ m. Achọrọ m ka akwalite m. Ị ga-ekpere m

ekpere?" Ya mere, mgbe m kwuputara nsogbu m nye gị, anaghị ekwuputa, anaghịkwa m

ekwuputa mmehie m nye gị, mana ana m ekwuputa nsogbu m na adịghị ike m

ya mere onweghị ọdị iche dị na nghọta

okwu abụọ ahụ bụ "mmehie" na nsogbu".

- Ndị ụka n'agbasa oziọma ekwebeghị na Katọlik

bụ ezi ndị Kraịst. Mgbe m dị na nwatakịrị

ụlọahịa ebe a na-ere akwụkwọ n'enwe akwụkwọ ndị n'agba ihe ndị Katọlik n'eme ọtọ, n'adọ aka na ntị

banyere ụka Katọlik. Mana ị gaa na ụlọahịa akwụkwọ,

ihe ha n'enwezi bụ rozarị; ha n'ere Baịbụl ndị Katọlik; n'erekwa ihe ndị Katọlik ji ekpe okpukpe.

Ihe anyị n'ahụzi bụ ihe edoghị anya n'etiti ndị n'agbasa oziọma Kraịst

na ndị ụka Katọlik. A na-akwadebe ndị mmadụ maka otu okpukpe

nke ga-ejikọ Katọlik, na ndị ụka Kraịst niile,

ya bụ okpukpe niile dị n'ụwa.

- Ndị n'akwalite otu okpukpe maka ụwa niile kwenyere na okpukpe niile

ga-eduga mmadụ n'ebe Chineke nọ, n'agbanyeghị na ha dị iche ka esi ele ha anya.

- Kama inwe chi ndị a dị iche iche, onwere ike enwere otu Chineke nke n'apụta ihie

ma n'egosi onwe ya n'ụzọ dị iche iche nye ndị mmadụ.

Kedu maka nke ahụ?

Anyị niile ọ na-efe otu Chineke, ndị Kraịst na ndị Alakụba?

- Echere m otu ahụ. Onwere ụzọ dị iche iche anyị si agakwu Chineke.

- Ma ndị Kraịst ma ndị abụghị, na ndị Alakụba, ha n'aga eluigwe, dịka uche gị si gwa gị?

- Ee, ha niile n'aga. Onwere ụzọ dị iche iche anyị niile si aga ya.

- Echere m n'onye ọbụla nke hụrụ Kraịst n'anya, ma ha

ọmaara ma ha amaghị, ha niile ka bụ otu anụ ahụ n'ebe Kraịst nọ,

ọbụkwa ihe Chineke n'eme taa: ọ na-akpọ mmadụ niile ka ha bịa mara ya,

ma ndị Alakụba, ma ndị Budha ma ndị Kraịst

ma ndị ekweghị ekwe, ha niile bụ otu ndị n'ebe ahụ Kraịst dị n'ihina

ọbụ Chineke kpọrọ ha. Ha nwere ike ha amaghị aha Jizọs, mana ha

maara n'obi ha na onwere ihe ha kwesịrị inwe ha enwebeghị,

ha kwesịrị ilegara ihie ha nwere naani ya

echere m na ha ga-enweta nzọpụta

anyị na ha ga-anọ n'eluigwe.

- Ruo mgbe m ga-anwụ, aga m ekwuputa ịhụnanya m nwere n'ebe ụmụnna m nọ

n'ime Kraịst: ụmụnna m ndị Katọlik, ndị Anglịkan,

ndị ndozi, ndị Luteran. Achọghị ịma nke ịbụ.

- ịmaara Jak, onwekwara ndị ụkọchukwu Anglịkan

ndị n'eme dịka isi eme. - Ee.

- Onweghị ihe inwere megide Vatịkan?

- Onweghị. Agaala m hụ popu

ọtụtụ oge. Ha kwenyere na Kraịst. Ha kwenyere n'ọnwụ Kraịst

n'obe na mbilite na ọnwụ. Echere m n'anọ m n'okpukpe niile.

Ewere m ma ndị Anglịkan ma ndị Baptist ma ndị Bredren Asembli

na ndị Katọlik na ha bụ otu ihe.

- Ịmaara, uche anyị niile abụghị otu ihe, amara m na ndị Mọmọn,

abụghị ndị ụka nkịtị, mana enwere uche sara mbara

na mgbe ọbụla mmadụ hụrụ Jizọs na'anya ma kwere

na ha bụ nwa Chineke, nke ahụ dị m mma.

- Rọbat Mcguines na ndị Famili Rịsịach Kansụl kwuru

n'onwere ihe nzuzo nke ijikọ ndị mmadụ n'otu okpukpe nke ga-eme ka ha

nabata nzube nke U.N n'udo ndị dịka ibelata mmụba mmadụ, ikwe ka ewepụ afọ ime,

n'otu ọchịchị n'ụwa.

- Ha niile n'abịakọta ọnụ n'ikike nke Lusifa.

- Ekwensu maara na iji nweta ndị mmadụ ikweta n'ụwa ọhụrụ ahaziri nkeọma,

iji nabata okpukpe ụgha, okwesịrị iji nwayọ n'eme ya.

ọgaghị n'eme ya n'ike . Ekwensu ji nwayọ etinye ma n'erikpu

okpukpe anyị. Ekwensu ji nwayọ emebi okwu Chineke.

oji nwayọ emebi eziokwu nke Baịbụl ndị Kraịst

ka owee nwe ike gbanwee ya ka ọbụrụzie otu okpukpe ọhụrụ nke ndị n'emegide Kraịst

ga n'efe dịka nke onyenweanyị Jizọs Kraịst.

- Ikweere na vashọn Baịbụl ndịọhụrụ

ga-arụ nnukwu ọrụ n'ụwa ọhụrụ a nke a na-ahazi?

- Echere m n'ọbụ ihe ga-ekwe omume, n'ihina ka a na-enwe nsụgharị ndị ọhụrụ

ọ na-eme ka enwee ụzọ ọzọ dị iche esi akọwa okwu Chineke nke mere

n'ọtụtụ na anabata ya. Mana enwere ihe karịrị ugbu a. n'ụma.

na nsụgharị ndị a, enwere ọtụtụ ndị

n'ewepụta Baịbụl maka ụmụnwoke ndị n'edina nwoke na ụmụnwaanyị ndị n'edina nwaanyị,

enwekwara ndị wepuru "nwoke" maọbụ nwaanyị,

Ya mere echere m na nsụgharị ndị ọhụrụ na ndị n'apụta ugbu a

n'emezi ka okwu Chineke ghara ịdị ire ka osi kwesị ma nye ohere ka okwukwe niile

na mmadụ niile bịakọta ọnụ ma ghara imejọ onwe ha.

Nke ahụ bụ ịdịnotu. -Ọdị mma.

- Ya mere ịdịnotu nke ndị Kraịst bụ ihe ngosi n'anyị n'ebi n'oge ikpeazụ.

- Baịbụl Kịng Jems ji okwu ahụ bụ "alammụọ" mee ihe ugbo .

Ihe m n'ekwu bụ, ịgụọ testament ochie na NIV, onweghị ebe

eji okwu ahụ bụ "alammụọ" mee ihe. Ịgaghịdị agụta okwu ahụ bụ "alammụọ na NIV ruo

mgbe iruru na akwụkwọ Matiu. Chegodi, maọbụrụ na vashọn ndịọhụrụ a

edere n'ụzọ dị mfe nghọta. Mana ajụọ ndị mmadụ

ma ha ma ebe alammụọ dị, ha ga-enwe ike gwa anyị n'ọbụ

ọkụ n'ebe ntaramahụhụ. Ọbụ ebe ndị mmadụ n'aga ma ha nwụọ maka ịnara ntaramahụhụ.

Anyị jụọ ha ihe "shoel" bụ

ụfọdụ amaghị.

Gịnị ka "shoel" pụtara?

- Nzobe? nzobe pụtara ichekwa ihe.

-Kwuo ya ọzọ. -Shoel.

- Gịnị? Sụpee ya.

- S-H-O-E... odochaghị m anya. E e.

-E e.

-E e.

- E e amaghị m.

- E e.

- E e.

- Hee, E e.

- Amaghị m.

- S Gịnị? S-H-O-E-L: shoel.

- E e. ewo, shoel? E e.

-Agaghị m echeta ya n'isi m.

- S-H-O-E-L? odoghị m anya. Ahụbeghị m okwu ahụ mbụ.

- E e, odochaghị m anya.

- Ọdịmma, ee. Okwu ahụ edochaghị ọtụtụ ndị anya.

Ichere n'okwu ndị a dị mfe karịa okwu ahụ bụ "alammụọ"?

-E e. Ọdịmma.

Ekweneyere m na Baịbụl Kịng Jems bụ okwu Chineke. Ekwenyere m na

onweghị ntụpọ ma kwerekwa na vashọn ndịọzọ n'apụta - ịmaara

na NIV, Amerịkan Standad - adịghị mma, na

ha si n'aka ekwensu. N'akwụkwọ gị, ọdịka ịhụghị

arụ dị na mgbanwe ndị a emere. Onwere ike

ikweghị na ekwensu ga-etinye aka imebi okwu Chineke maọbụ

mgbanwe ndị a dị njọ, na ihe ndị a dị iche

si n'aka nwoke ahụ nke sị, "aga m agbanwe arụ ndị a n'ihina abụ m onye ọjọọ,

n'ihina achọrọ m ịgbanwe okwu Chineke."

- Ekwere m na Chineke echekwawo okwu ya.

- Mana ikwenyeghị na nke ahụ - dịka iheatụ, ihi okwu ahụ

bụ " echiche ndị n'arọ otu" mee ihe ruru ugbo iri abụọ n'akwụkwọ gị - ikweere

n'onweghị echiche ọjọọ ịgbanwe okwu Chineke?

E e, Echere m na nsụgharị Baịbụl niile dị iji gbanwee okwu Chineke.

Mana odoro anya; ha doro anya.

- Mana ha ọdịbu mgbe ahụ? ọbụrụ n'onwere ndị nọ taa bụ ndị

n'etinye ihe dịka nke Niu Wọld Transleshọn

nke na'agbanwe okwu Chineke - Ikweere?

- Ee.

Ọdịmma. ọbụrụ na ndị mmadụ n'ekpu okwu Chineke ihu n'ala taa

site n'iji Niu Wọld Transleshọn, dịka iheatụ, ha n'ekpudo okwu Chineke ihu n'ala n'oge Pọl,

ọdọrọ aka na ntị maka ya - gịnị mere iji kwere na ndị mmadụ n'ekpu okwu Chineke ihu na ala

n'oge nke atọ, nke anọ oge anyị, asatọ, na itolu?

- Anyị maara na Niu Wọld Transleshọn bụ mgbanwe nke okwu Chineke.

Ọdị mfe nchọpụta. Ihe m ji jiri okwu ahụ bụ "echiche ndị n'arọ otu

bụ na inwere ihe ị ga-eji kwalite ihe ndị a, n'abụghị, "ọdịmma, ọdị m ka nke ahụ."

"Ịmaara, na naani ebe ihe a dị bụ na Niu Wọld Transleshọn hapụrụ ime ntụgharị adabaghị

bụ ebe ndị Wọchtọwa Baịbụl na Trakt Sosaiti n'ekwenyeghị na

ozizi Baịbụl nke ndị Kraịst.

- Onwere ike ịgụbeghị Job : na Niu Wọld Transleshọn.

- N'ihi gịnị?

-N'ihina Job :, na Baịbụl Kịng Jems okwuru sị, " ihe ahụ

nke nnu adịghị a ga-eri ya n'etinyeghị ya nnu? Ka onwere nnu nke dị na ebe dị ọcha nke akwa?"

na Niu Wọld Transleshọn, okwuru sị, "onwere ihe ụtọ

na mmiri n'alọ alọ nke mashalo?"

Onwere ihe ha gbanwere nke n'enweghị

ihe jikọrọ ha na ụlọnche! ọdịmma" ya mere ihe m n'ekwu bụ ...

- Itinyere ihe ndị ahụ n'ụbụrụ?

Imere otu ahụ...Ee emere m ya.

-Iburu ya n'isi?

Amaghị m na mashalo nwere mmiri n'alọ alọ

-Echere m n'ọbụrụ n'inwere Niu Wọld Transleshọn...

- Ee, enwere m.

-...Aga m achọ igosi gị. Mana ikweere n'ihe m kwuru?

-Mana ịmaara? N'onwere mbipụta nke pụtara ọhụrụ n'izu ụka gara aga.

- Odoro m anya n'okwukwara mashalo, mana aga m ele anya.

- Aga m ele.

- Mana lekwa ihe m bu n'uche: kedu maka ndị niile nọ -

mana ịnụla ya n'oge n'oge; anụla m ya oge n'oge - na

agwara gị, " ewo, ihe niile juru na Baịbụl n'emegide onwe ha"?

- Ana m anụ ya mgbe niile

- Ọbụ onweghị ihe a ga-eme iji kepụta ihe nke megidere onwe ya, iji mee ka ...

- Ha anaghị...

- ...maọbụ itinye ihe enweghị isi na Baịbụl,...

- E e, E e, E e,E e.

-...itinye ihe ndị enweghị isi na Baịbụl dịka, " Sọl dị otu afọ

mgbe obidoro chiwa dịka eze"?

- Samuel : na vashọn Kịng Jems sịrị, "Sọl chịrị otu afọ; na mgbe

ọchịrị afọ abụọ na Izrel ..." na Inglish Standad Vashọn, ọbụ

k'esi gbanwee ya gazie na " Sọl biri ndụ naani otu afọ ma bụrụ eze"

- Samuel : na Duwe Remes vashọn bụ Baịbụl ndị Katọlik:

"Sọl bụ obere nwa dị otu afọ mgbe obidoro ịchị,

ma chịa afọ abụọ na Izrel."

- Ịmaara ihe amaokwu ahụ gwara anyị? na Sọl dị naani otu afọ mgbe

ọbụ eze. Lekwa ebe nsogbu dị: Samuel : sịrị, "N'ubu ya

ọkarịrị mmadụ niile elu." Ya mere dịka Inglish

Standad Vashọn, ọdị naani otu afọ mgbe ọbụ isi n'ubu ya dị elu

karịa nke mmadụ niile. Nke ahụ bụ nwa buru ibu.

Ihe m n'achọ ịgwa unu bụ na Baịbụl ndị adabaghị.

Oge ụfọdụ anaghị m adọtacha mkpụrụobi nke na ndị mmadụ n'asị m, "ekwetaghị m

na Baịbụl n'ihina onwere ọtụtụ ihe emetaghị na ya."

Ana m asị ha "Gosi m otu n'ime ha".

Ha n'ewepụta NIV. Ihe m n'agwa ha bụ, "egosila m - aga m egosi

ebe ihe ekwesịghị dị na ya. Aga m egosi gị ka ha si emegide onwe ha.

Gosi m otu na Baịbụl Kịng Jems. Ịgaghị enweta otu."

- Lee mgbanwe ọzọ Baịbụl ndịọhụrụ mere, Galeshịa isi ise:

"Aga m ewepụ ihe ahụ n'emekpa gị ahụ."

NIV kwuru sị, "nye ndị ahụ n'enwe mwute , ọ ga-amasị maọbụrụ na ha gaa

ebe niile iji napụ ha ike ha!"

Ichere na Baịbụl ga-akụzi ihe dị otu a n'onyeozi

Pọl kwuru? Ma ikwuru, "ọdịmma, echeghị m n'ihe ha bu n'obi

na NIV." Ọdịmma, ọbụ ya mere Kọmọn Inglish Baịbụl ji sụgharịa ya,

"ọ ga-amasị m ka ewepụ ndị n'akpasu gị iwe!"

maọbụ ka Kọntempọrarị Inglish Vashọn si tinye ya,? Ahụla m nke a na

ebe a na-ere akwụkwọ n'ahịa. "ọ ga-amasị m ka onye ọbụla nke n'akpasu gị iwe

abụghị naani n'aga ebi ha ugwu kama ikewapụ ha kpamkpam".

Ị na-ege ntị na nke a? N'ihina okwu a bụ "ibibi ha" enweghị ihe ya na

mmadụ ịbụ onye ebere ugwu maọbụ ibepụ anụ ahụ nwekọrọ.

Pọl n'ekwu banyere ihe dị na Testament ochie banyere ndị

n'enupuru Chineke isi, n'aga ebibi ha. Lee anya, enweghị m ohere igosi

onye ọbụla ọtụtụ ebe ọdị. Naanị ihe ọ na-ekwu bụ na

aga ewepụ ha, uche ya bụ ka ewepụ ha, uche ya bụ

ka Chineke bibie ha. Ya ka okwu ahụ bụ "ibibi ha" pụtara.

Chineke ga-ala ha n'iyi maọbụ "ibibi ha" nwere ike ịpụta n'aga

ewepụ ha n'ọgbakọ, wepụ ha na mgbakọ. Wepụ ya na mba

Izrel. Ya ka okwu ahụ bụ "ibibi ha",iheomimi a nke

vashọn ndịọhụrụ tinyere okwu onyeozi Pọl otu a, " Nna, ọ ga-amasị m ka unu

n'ebepụ onwe ha ahụ. Ọ ga-amasị m ka onye ọbụla bee onwe ya ugwu. Ọ ga-amasị m

ka ha bewasịa onwe ha ahụ." ihe m n'ekwu bụ n'ọbụghị ihe ọ na-akuzi ma ọlị.

Ọbụ nnukwu ihe ijuanya.

Ọbụghị naani na vashọn ndịọhụrụ a nwere ihe enweghị isi dị na ya nke mere

ka Baịbụl n'eyizi k'ọdị iberibe, onwere iheọzọ ha bu n'uche iji kwado ndị mmadụ

maka ụwa ọhụrụ ahụ ahaziri nkeọma. Nkwado ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ

ndị Kraịst rubere ndịọchịchị isiọma. Ihe bụ isi

bụ na ha metụrụ Ndị Rom aka.

- Enweree m onwe m ime onwe m ohu. Enweere m onwe m inyefe onwe m n'inyefe ikike m.

Enwere m onwe m inyefe onwe m ndị ọchịchị. Ọbụnadị

ndị ọchịchị ọjọọ n'arụ ọrụ dị mma site n'ime ka ogbe dịrị jụụ maka ndị mmadụ.

ọbụnadị ndị ọchịchị nke Sọviet Uniọn n'aka Stalin n'arụrụ Chineke ọrụ.

Ọbụnadị Chaịna nke nọ n'aka Mao Ze Dọng n'arụrụ Chineke ọrụ. Sọpụrụ ndị ọchịchị. Mee ya

ma oruru ka enye ya nsọpụrụ ma orughị. Kwanyere gọvanọ gị ugwu; kwanyere

onyeisi ogbe ugwu, ma okwesịrị ma okwesịghị. Kwanyere onye ọchịchị ugwu.

Onweghị onye ga-ejide ihe eji alụ ọgụ. Anyị ga-eji ngwaọgụ.

[Akụsiri aka n'ụzọ ike]

- Taa na Niu Olins ha jidesiri otu ihe ike.

- Ngalaba ndị uweoji! ịnọ n'ụlọ?

- Ọbụghị naani ebe mmiri nọ, mana ebe Niu Olins

ebe kasị kọ mmiri n'ebe ndị kasị nwe ego n'anọ.

- Mana imebi egbe ndị eji eme ihe bụ ihe emere mgbe enwere nsogbu n'ọnọdụ nchekwa ndụ,

mgbe enwere Họrịken Katrịna na Niu Olins. Ndịagha U.S bịakwara.

N'eme ka egwu ghara ịtụ ndị mmadụ n'igbochi ọtụtụ ihe ekwesịghị bụ ihe dị mkpa,

nke bụ ihe ndị akpọrọ Kleji Respọns Tim

nyere aka ime na Niu Olins.

-Ihe bụ isi anyị n'agwakarị ndị mmadụ bụ " ka ha

nye aka ịhụ n'ihe gara nkeọma, nke ga-enyere anyị aka

mgbe nsogbu ndị a gasịrị."

- Ndị a akpọrọ Kleji Respọns Tim ga-eje ije ịhụ na

egboro mkpa ndị ọchịchị n'ọha mmadụ.

Nye ndị ụkọchukwu, Ihe ha jirila mee ihe nke

nke nyere ndị mmadụ aka ibelata egwu ndị mmadụ n'ịsọpụrụ iwu bụ Baịbụl, Karịsịa Ndị Rom .

- N'ihina ọbụ Chineke guzobere ndị ọchịchị. Ọbụ ihe anyị kwere na ya

n'okwukwe ndị Kraịst;ọbụ ihe akwụkwọ nsọ kwuru.

- Mana cheregodi. Ọbụrụ n'onye uweoji abịa n'ụlọ m ma kwuo,

" Sachaa ụgbọala m, ohu"? Baịbụl ọchọrọ n'aka ịsọpụrụ ha otu ahụ?

Ọdịmma, gịnịkwa maọbụrụ n'onye uweoji agwa m ka m mee ihe iwu akwadoghị? Ihe m n'ekwu bụ

onye uweoji bịara gwa m, " Lee? Achọrọ m ka ịrịa elu

ma banye n'ụlọ mmadụ ma site na windo banye

ịhụ ihe ndị mmadụ n'eme. Achọrọ m k'ịchọpụtara m ihe ndị agbataobi n'eme"?

Ekwesịrị m ime otu ahụ? Ikwuru sị, " ị na-eme iheatụ ndị enweghị isi n'ọdụ."

Ọdịmma. Onwebeghị ọchịchị ebe ọbụla

nke nyere iwu k' ị na-esogharị ndị mmadụ ebe ọbụla ha nọ. Onwebeghị ebe nke ahụ mere? Ọdịmma?

Onweghị ihe dịka Nazi Jamini; Onweghị ihe dịka Sọviet

Uniọn; Ya mere mechie ọnụ mee ihe agwara gị. Ndị Rom bụ akụkụ

akwụkwọ nsọ nke kọwara nzube ndị ọchịchị inye ndị dara iwu ntaramahụhụ, n'ịhụ ihe niile gbasara ha

ma gwa anyị ihe anyị ga-eme mgbe niile.

Mana iheọzọ dị mkpa nke akụziri na Ndị Rom bụ n'anyị kwesịrị ịkwanyere ndị ọchịchị ugwu

Dịka iheatụ, na Unaịted Steeti, anyị nwere ogo dị iche n'ọchịchị,

ọbụghị ya? Ugbu a, gịnị bụ iwu kasị elu? ọdịmma, ọbụ iwu Chineke.

Anyị kwesịrị ịsọpụrụ Chineke. Nke ahụ gasịa ọbụ iwu Unaịted Steeti

n'ihina iwu Unaịted Steeti bụ iwu kasị elu.

Ikwuru sị, " ọdịmma, Baịbụl kwuru sị, kwanyer eze ugwu, ya mere anyị kwesịrị iji sọpụrụ

Ọbama."Mana cheretụ. Ọbama ọbụ eze? Ọchịchị anyị ọbụ

nke onye eze n'achị? Anyị nwere ndị ahọpụtara n'ahụ

maka ndị mmadụ, ha akaghị iwu elu, iwu nke ala anyị,

bụ iwu U.S. Ọbụrụ n'anyị ga-akwanyere ndị ọchịchị ugwu

ndị eguzobere maka anyị, ọbụrụ n'anyị ga-akwanyere iwu ala anyị ugwu,

nke ahụ pụtara n'anyị ga-asọpụrụ iwu Amerịka. NIV wepuru kpamkpam

ozizi ahụ. Ọkụzighị ka ịgbasoo ike ndị dị n'elu; okwuru naani:

Kama ikwu, ịmaara, " ka mkpụrụobi niile nọrọ n'okpuru

ike. Maka onweghị ike nke ka nke Chineke: Ike nke enwetara

site n'aka Chineke", nke n'ekwu n'onweghị onye ọbụla n'okpuru anyanwụ

ike niile n'abụghị Chineke. Kedu ihe mere ụmụaka kwesịrị iji sọpụrụ nna na nne ha?

N'ihina Chineke sị ka ha mee otu ahụ. Gịnị mere anyị ji asọpụrụ ndị ọchịchị? Gịnị mere anyị

ji asọpụrụ ọchịchị mmadụ. N'ihina Chineke gwara anyị

na ya n'eji ọchịchị mmadụ enye ndị dara iwu ntaramahụhụ, n'iji chekwa ha

pụọ na mmerụ ahụ. Ebe a ka Nev Livin Transleshọn

na Ndị Rom :. "Onye ọbụla kwesịrị ịnọ n'okpuru ndị ọchịchị. Maka ọchịchị

niile si n'aka Chineke,"- lee nke a - "ndị n'achị achị bụ

ndị Chineke dobere ka ha nọrọ."Nke ahụ bụ eziokwu. Niu Livin Transleshọn

n'ekwu n'onye ọbụla n' achị achị nwetara ikike n'ebe Chineke nọ.

Nke a abụghị eziokwu, maka otu ụbọchị ndị n'emegide Kraịst

ga-enweta ikike ịchị achị site n'aka Setan. " Dragọn ahụ nyere ya ...ikike", okwuru na

Mkpughe . Ọbụghị naani nke ahụ, mana na Hosia [:],okwuru sị, " Ha eguzobela

ndị eze, mana ọbụghị m". Onwere ọtụtụ ugbo mgbe mmadụ tinyere ndị ọchịchị

imegide nzube Chineke. Ebe ahụ ka Niu Livin

Transleshọn si ekwu n'amaokwu , " Kwụọ ụtụisi, n'ihi ihe ndị a.

Ekwesịrị ịkwụ ndịọrụ ụgwọ. Ha n'efe Chineke n'ihe ndị ha n'eme.

Kwụọ onye ọbụla ụgwọ iji ya: kwụọ ụtụisi gị na ụgwọ ndịọzọ

nye ndị n'anakọ ya". Ka chi bọọ! Ọbụghị naanị n'ụtụisi; ọbụkwa ụgwọ,

nke ahụ kasị njọ. Kịng Jems n'agwa gị k'ịkwanyere ndị ọchịchị ugwu

n'ogo dị iche iche, n'ogo ọlụ ha dị, n'ihe

ha kwesịrị ị na-eme, nakwa, n'ihe eji

amata ndekọ niile ma ha ozuru ezu.

Gịnị mere na Kịng Jems esighị n'uche Chineke? N'ihina osi n'otu akwụkwọ

- ọdịmma, ọdịghị otu ahụ. Onwere ọtụtụ ebe Niu Kịng Jems na

Testus Reseptus si ghaa ụzọ ma kwuo iheọzọ dị iche n'ihe Kịng Jems n'ekwu.

- Ọbụghị na Testament ọhụrụ.

- Ọdị ya, eziokwu.

Onwere ebe dị iche iche ya na TR n'agha ụzọ.

- Niu Kịng Jems bụ vashọn jọkarịrị njọ

maka ọ na-eduga mmadụụ iche sị, "Ewo, ya na Kịng Jems bụ otu; ọdị

ọhụrụ, ma nwee okwu ọhụrụ ndị etinyere na ya. Ọbụrụ naani ihe dị, agaghị ekwuputa ya.

- Ọtụtụ ndị agaghị achọ imetụ NIV aka maọbụrụgodi n'ọnọrọ oteaka -

ha agaghị emetụ ESV aka maọbụ Niu Livin Transleshọn maọbụrụgodi n'ọnọrọ oteaka

mana ha sịrị, "Bịa, Pastọ Andasọn, Niu Kịng Jems? Ya na

Kịng Jems bụ otu. Ha ga-ewepụ 'ihe a' na ndị a'.

ya na Kịng Jems bụ otu, naani n'ọdị mfe nghọta."

Ọdịmma. Ka m gwa gị ihe ụfọdụ na Kịng Jems. Niu Kịng Jems

wepụrụ okwu ahụ bụ" Onyenweanyị" ugbo . Owepụrụ okwu ahụ bụ "Chineke" ugbo .

Owepụrụ okwu ahụ bụ "eluigwe" ugbo . Owepụrụ okwu ahụ bụ "nchegharị" ugbo .



ma wepụ okwu ahụ bụ "Jehova" kpamkpam, wepụ okwu ahụ bụ "ịlaniyi",

wepụ kpamkpam okwu ahụ bụ "Testament ọhụrụ", wepụ kpamkpam okwu ahụ bụ

"ekwensu". Baịbụl abụghị ihe enweghị isi; ikwesịrị ịdị nkọ. Ikwesịrị

ịmụ ya. Ikwesịrị ịmụ asụsụ ya. Ọ na-atọ

ọchị ka ụmụaka m si aghọta ya, mana itoola mmadụ, ma ị gaghị aghọta

ya? ọ natọkwa ọchị ka otu ndị ahụ si ekwu na Kịng Jems

siri ike nghọta, nke n'ikwesịrị ịmụ Grik maọbụrụ n'ịchọrọ

ịmata ihe Baịbụl kwuru? Ee, nke ahụ agaghị esi ike nghọta.

"Kịng Jems siri ike nghọta nye gị. Nke a bụ Testament ọhụrụ Grik."

Ndị a enweghị ihe dị ha n'isi.

Ka anyị lee ọtụtụ amaokwu ma mara nke dị mfe nghọta.

Kịng Jems ji okwu siri ike mee ihe dịka osisi, "osisi siri ike".

Ya mere Niu Kịng Jems chere, "aw, nke a siri ike. 'osisi siri ike'?

ịmaara ihe ị na-ekwu?" Ha ji "osisi terebint". Nke ahụ

dị mfe nghọta, ọdịmma? Ugbu a Ndị ikpe : nwere okwu ndị siri ike

na Kịng Jems, "anyanwụ nọ n'elu".

Ọdịmma" Amaara m na ha niile ga-adị na "Họp na Pọp".****

"Anwụ nọ n'elu". Ha gbanwere ya ma tinye ya " Mgbago nke ndị Heres"

"Ndị si na Heres."

Samuel :. Kịng Jems

Kịng Jems gbanwere "pim", P-I-M. "Pim". Nke ahụ dị mma

maka egwuregwu, mana anụbeghị m okwu ahụ mbụ

Samuel : ji okwu a siri ike, "osisi". Ya mere Niu Kịng Jems

kpebiri iwelitezi ya k'ọbụrụ "osisi tamarisk" iji mee ka ọdị mfe nghọta.

Samuel :; kwuru sị "kọnet".

onye ma ihe kọnet bụ?

Ọbụ ụdị opi, ọbụ ya? Ọbụ ụdị ụbọakwara.

Ha wee kpebie iji okwu dị mfe nke bụ "sistrum"

"Sistrum". N'ihina onye ọbụla ma ihe sistrum" pụtara.

Onye ma ihe "sistrum" pụtara?

Onye ma ihe kọnet pụtara?

Ka anyị chọpụta.

Aịzaya : ji okwu siri ike bụ "nwoke" mee ihe na Kịng Jems.

Ya bụ, ka chi bọọ! tinye Kịng Jems n'ebe nchekwa ihe n'adị. "Nwoke"

Nye m ihe m ga-aghọta. "Mmadụ nkịtị", ọdịmma?

Daniel : ji okwu siri ike bụ "ụmụeze ndị nwoke", ya mere, ha ji okwu dị mfe

mee ihe na Kịng Jems, "setrap".

"igwe mmadụ"?

"igwe mmadụ" na Kịng Jems; nke ahụ siri ike nghọta. Ka anyị jiri "ndị agha" mee ihe.

Ọdịmma, onweghị onye ga-aghọta ihe "aja dị nro pụtara"

nke ahụ enweghị isi. Aja dị nro na Ọlụ ndị ozi :? "aja Siraịtis" dị mfe nghọta.

Ọka mma inweta Niu Kịng Jems. Ọdị mfe nghọta.

Niu Kịng Jems ọdị mfe nghọta?

Onwere ọtụtụ ebe gosiri n'ọdị mfe nghọta. Nke ahụ

ezuchaghị ezu. Nke ahụ bụ naani iheatụ.

Nke ahụ enweghị ihe jikọrọ ya na k'osi osighị ike nghọta, onweghị ihe

ya na mgbanwe emere jikọrọ, ọ na-emebi ya, n'akpọdo ya isi n'ala, n'atụgharị ya. Naanị ihe

ha ga-ejide aka ma kwuo maka ya bụ, "ọdịmma, ebe a bụ ebe anyị mere k'ọdị mfe",

ọ na-ewepụ "mụ" na "gị". Mana inwere

"mụ" na "gị" n'ihina "mụ" na "gị" bụ ịnọrọ onwe

na "gị, nke gị, nke gị" nọọrọ onwe ha. Ndị nke bidoro na TH bụ ndị nọọrọ onwe ha;

Ndị bidoro na Y bụ ndị gbara mkpị. Ọ na-emetụta ihe ọpụtara n'ihina site na mgbe ruo na mgbe

ịgaghị ama maọbụ otu onye ka a na-agwa okwu maọbụ ọha mmadụ,

ọgwụla ma inwere "gị" na mụ nke ga-eme k'ịmata nke ahụ.

Ọdị mkpa. Ọdị nnukwu mkpa. Mana ka m

gosi gị mgbanwe ụfọdụ nke dị na Niu Kịng Jems nke mere k'ozizi ahụ burụ ihe gbagọrọ agbagọ.

Gaa na Kọrint :.

- Ozizi nke obe bụ maka ndị n'alaniyi; mana nye

anyị bụ ndị azọpụtara ọbụ ike Chineke."

- Nwanna Garet, gụọrọ m nke ahụ nkeọma n'olu dara ụda na Niu Kịng Jems.

-" Maka oziọma nke obe bụ iberiibe nye ndị n'alaniyi,

mana nye anyị bụ ndị a na-azọpụta, ọbụ ike Chineke."

- Ya mere lee anya, na Kịng Jems, okwuru n'azọpụtala anyị. Na Niu Kịng Jems

okwuru n'aga azọpụta anyị. Ihe dị iche dị na nzọpụta

n'ihina ọbụ ihe n'adịgide adịgide. Nzọpụta n'abịa na mgbe ya, n'otu ntabi anya, anyị

ekwere na Kraịst, ma site n'ọnwụ fee na ndụ. Ọbụghị usoro.

Anaghị azọpụta m;Azọpụtala m!

- Amen.

- Kọrint : kwuru sị: "Anyị bụ ihe ụtọ nke Chineke site n'aka Kraịst,

nye ndị azọpụtara, na ndị a ga-alaniyi".

Gụọrọ ya site na Niu Kịng Jems.

-"Anyị bụ ihe n'esi isi ụtọ site na Kraịst nye ndị a ga-azọpụta

na ndị a ga-alaniyi".

- ọzọ, ọbụghị n'azọpụtaghị, mana ndịọzọ

a ga-azọpụta, n'ihina ọbụ ihe n'adịgide

Matiu : dịka iheatụ, na Niw Kịng Jems sị, "ụzọ ahụ

nke n'eduga na ndụ siri ike, ọbụkwa naani mmadụ ole na ole n'achọta ya". Kịng Jems sị

"Mkpagide" n'arụtụ aka mmadụ ole n'aga, n'arụtụ aka

n'ọbụ mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta. Niu Kịng Jem kwuru n'osiri ike.

Ugbu a ọbụrụ n'ọbụ ọrụ, a ga-esi ike.

- Niu Livin Transleshọn kwuru sị, "Mana ụzọ ahụ nke n'eduba na ndụ dị warara,

ma dịkwa mkpagide, naani mmadụ ole na ole n'achọta ya" Inglish Standad Vashọn

kwuru sị, "ụzọ ahụ dị warara, ma ụzọ ahụ siri ike nke n'eduba na ndụ,

ndị n'achọta ya dị ole na ole". Ugbu a ikwuru sị, "ọdịmma, Pastọ Jimenez, kedu ihe siri ike

na ya? Ọkwụ ọtọ, mkpagide? Mkpagide, siri ike? siri ike?

Kedu ihe siri ike na ya? Lekwa ihe siri ike na ya: osiri ike inweta nzọpụta?

- Lee, Jizọs mere ebe siri ike. Osiri ike ịnabata onyinye? Osiri ike ịnabata

mmiri? Osiri ike isi n'ụzọ gafee? osiri ike

ịta achịcha? Ihe ndị a ka Jizọs ji nzọpụta tụnyere

n'ihina ọdị mfe inweta nzọpụta n'ihina

ịgaghị abanye n'eluigwe otu ahụ. ịmaara n'eziomume nke Baịbụl kpọtụrụ uche, dịka n'akwụkwọ

Hibru? Zuo ike.

Lee, izu ike osiri ike?

Ekwela k'eduhie gị site n'ihe vashọn ndịọhụrụ n'ede. Enwere ike ịnwa gị otu ụbọchị

"Ee, ịmaara n'ụka a ji Niu Kịng Jems eme ihe, gịnị wee mezie?"

ọbụ nnukwu ighe.

Ichere na Baịbụl dị iche iche dị anyị mkpa?

- E e. Ekwuru m n'anyị nwere nke karịrị akarị. Ọdịghịzi mkpa inwekwa ndịọzọ.

Onweghị mkpa ọdị inwe ndị a n'apụta kwa ụbọchị

kemgbe ogologo oge. Amaara m ihe kpatara ya.

-ọdịmma.

Ọdị mfe. Ọbụrụ na mmadụ enwee ebe a na-ebipụta akwụkwọ

ma chọọ ịmụ Baịbụl maọbụ iheọzọ - nke n'abụghị m onye eji ịmụ Baịbụl mara -

- Ma mụkwa.

- Ihe ha mere bụ n'ọbụrụ na ha bụ ndị ejikarị ibipụta akwụkwọ mara

ikwesighị ịkwụ ụgwọ nye onye dere akwụkwọ, nke mere n'onye ọbụla ga-asụgharị nke ya.

- Ọdịmma. Onwere ego a ga-etinye maka

mbipụta vashọn ndị a niile.

- Onwere. Onweghị ihe ịrụ ụka dị na ya.

- Chineke ọ na-atụ anya ka onye Kraịst ọbụla mụta Grik mbụ ahụ eji dee Baịbụl

- Chineke n'atụ anya ka onye Kraịst ọbụla jiri ndekọ ya kpọrọ ihe,

anyị n'ebi n'oge enwere ọtụtụ ebe anyị ga-esi nweta iheọmụma

karịa ọgbọ ọbụla ọzọ, anyị chọkwara ya ugbu a n'ihina

mmegide dị na ya akawanyebeghị njọ

-ịhụrụ ihe ize ndụ, ọdịmma - Lekwa ihe m kwere maka ya. Echere m n'ọbụrụ na mmadụ

mụta Koin Grik ma n'asụ ya nkeọma, na-agụkwa ya nkeọma

nke ahụ ga-amagbu onwe ya, mana ...

- Ọmụta obere Grik bụ ihe jọrọ nnukwu njọ.

- Otu ahụ k'ọdị. Ọbụ n'onweghị iheọjọọ ịhụrụ na mmadụ

mụrụ banyere Baịbụl Grik na Kọleji n'oge ọmụmụihe abụọ, ma ha ebilie sị - dịka,

naani onye amaara nkeọma n'oji Kịng Jems eme ihe ga-asi - na ya ji oge ọmụmụihe abụọ mụọ Baịbụl na Kọleji

n'asụsụ Grik - ma ọ ga-ebili kwuo, " ndị sụgharịrị Kịng Jems,

ha asụgharịghị ya nkeọma." Ma dịka nhichapụ nke aka ya, ịmaara,

afọ asaa nke ndị mmụta dị iri ise ndị pụrụ na windo maka...

- Stivin, a na-emebikarị ihe ọbụla dị mma. Obere Grik dị njọ

Anụla m oziọma a niile dabere na nkọwa ọjọọ enyere na ya, ọdịmma?

Mana ka m kwuo n'afọ ole gara aga onwere onye oziọma bịakwutere m ma sị m, " Lee,

Ahụrụ m okwu ekwuru maka ya. Nna, oziọma a

anụbeghị m ebe onyeọzọ kwuru ya. Ịmaara Grik. Inwere ike ilebara m ya anya?"

Enyere m ya aka leba ya anya. Onweghị ihe ojiri dịrị iche, ọbụ otu n'ime

nkọwa maka ya arụtụrụ ya aka

mgbe m gwara ya? Okwuru ya otu ahụ.

- N'ihina ọdara ụda nkeọma nke mere k'onwee mmasị na ya.

- N'ihina okwuru ya nkeọma.

- Ọbụ ihe nnukwu okwu dị na ya.

- Ewo, oburu ibu.

- Ọgbanwojughị m anya.

- N'ụzọ n'ewute, ọgbanwojughị m anya.

- Onweghị onye ekwetaghị na nke mbụ ya si n'aka Chineke.

[ Pita :] Baịbụl kwuru sị, Ndị nsọ nke Chineke kwuru okwu

mgbe mmụọ n'eme ka ha kwuo."

Mana ha ekwenyeghị ihe anyị nwere taa dịka ihe si n'aka Chineke

n'ihina ha ekwetaghị n'echekwara Baịbụl, mana ịmaara na Baịbụl

kwuru na Abụọma :, " Okwu ONYENWEANYỊ dị ọcha: ka ọlaedo dị n'elu ụwa,

nke ehichara ugbo asaa. Ị ga-edebe ha, BIKO ONYENWEANYỊ, ị ga

echekwa ha n'ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi." Ịmaara n'otu Chineke ahụ

nke nyere anyị okwu ya bụkwa onye ga-echekwa okwu ya.

Ọbụkwa iberibe iche na Chineke siri nnukwu ike iji

ndị mmehie mee ihe n'inye anyị ihe zuru oke, ọbụkwa otu Chineke ahụ

ga-eji ndị mmehie mee ihe iji hụ n'echekwara ya maka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi?

Ekwetara m na Chineke siri ike inye anyị okwu ya, ekwekwara m na Chineke

siri ike ichekwa okwu ya ndị ahụ

n'ọgbọ niile ruo mgbe ebighị ebi.

Ka m jụọ gị nke a:Ikweere na ndị mmadụ kwesịrị ịmụta Hibru maọbụ

Grik maọbụ Oyibo, k'ọbụ, a ga-enwe Baịbụl n'asụsụ niile?

-Ha ga-enwe Baịbụl n'asụsụ niile. Nke a mere anyị ji akwado

ndị n'asụgharị akwụkwọ nsọ site oziọma bụ Baịbụl Intaneshọnal. Testus Reseptus bụ

nke eji mee ihe ya na Baịbụl Hibru, iji sụgharịa ya

n'asụsụ ndịọzọ, nke ga-abụ okwu Chineke.

Anyị kweere na onye ọbụla kwesịrị inwe Baịbụl n'asụsụ ha,

na Inglish, ọbụ Baịbụl Kịng Jems.

- Ka m mechie n'ikwu nke a: Echekwala okwu Chineke nye anyị n'ọgbọ a.

Gee Aịzaya : ntị. "Nke a bụ ọgbụgba ndụ nke mụ na ha nwere,

Ka ONYENWEANYỊ kwuru; Mmụọ m nke nọ n'ime ha, n'okwu m nke m tinyere

n'ọnụ ha, agaghị apụ n'ọnụ ha, maọbụ n'ọnụ nke mkpụrụ m,

maọbụ n'ọnụ nke mkpụrụ nke mkpụrụ m, ka ONYENWEANYỊ kwuru, site n'ugbu a

ruo mgbe ebighị ebi." Okwuru sị, " Lee, Aịzaya. Ozi nke ị na-ezisa,

ụmụ gị ga-ezi ya. Ụmụ gị n'ụmụ gị

bido ugbu a gaa n'ihu ma ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-enwe okwu ya" nke n'ekweere m

n'okwu ahụ dị n'aka m ugbu a. Ma lee,

vashọn ndịọhụrụ, ma ha bụ NIV, ESV, Niu Livin Transleshọn, maọbụ

Niu Kịng Jems, n'echiche mmadụ bụ echiche mmadụ nke sị n'okwu Chineke

ekwesịghị k'echekwa ya. Anyị kwesịrị igwuputa ndịọhụrụ. Anyị ga-egwuputa ndị

ebe mbụ edere ya ma gboo nsogbu niile dị ya. E e, ekwenyere m na

echekwara ya site n'oge Kraịst ruo ugbu a. Emeela k'orute anyị aka

aka taa nke na ha niile esila aka banye n'aka, banye n'aka ọtụtụ ndị ruo taa.

Ọtụtụ ndị kwenyere na Baịbụl Kịng Jems enweela ọtụtụ mgbanwe ọtụtụ afọ ugbu a,

nke anyị ji eme ihe taa dị iche

na nke , mana ihe doro anya dị iche na ha abụọ bụ nsụpe ụfọdụ,

ime ihe edere ede k'ọdị obosara, itinye rịkọm, n'ihe edezichaghị nkeọma; onweghị okwu gbanwere.

Okwu ndị anyị nwere taa na Kịng Jems bụ otu ihe ahụ

ndị sụgharịrị Baịbụl nyere anyị kemgbe .

Okwu ndị ahụ agbanwebeghị, echekwara ya,

ọbụkwa Chineke kwere na nkwa, n'ọ ga-echekwa ya.

Okwuru sị, lee, "Eluigwe na ụwa ga-agafe, mana okwu m

agaghị agafe. " okwughị uche;

okwughị na nkwenkwe; okwuru sị, "okwu m agaghị agafe." Vashọn ọhụrụ ndị a si n'ebe rụrụ arụ

ha nwekwara mkpụrụ rụrụ arụ. Lee mkpụrụ nke vashọn ọhụrụ ndị a.

Lee ka chọọchị dị ugbu a: ebe ngwuriegwu. Lee ka

chọọchị dịzi n'ihi vashọn ọhụrụ ndị a: nke juputara

na ndị agaghị azọpụta. Nke juputara na mmadụ ndị enweghị ozizi, ndị enweghị ihe

ha ji ihe ha kweere na ya kpọrọ, maka mgbe ị na-agụ akwụkwọ nke juputara na ngwakọrịta dị iche iche,

osiri ike ichebara ozizi echiche. Man mgbe ị na-agụ akwụkwọ

nke zuru oke ma zue ezuo nke mere k'echekwa ya, ịmaara, n'ilere okwu niile dị ya ma ọdịmma

ichebara ozizi echiche n'ikwesịrị ichebara ihe ọ na-ekwu echiche n'ikwesịrị

ịma ihe obu n'uche, n'abụghị, "ọdịmma, ehe, aghọtala m ihe dị na ya. Jizọs nwụrụ n'obe

aghọtara m ya." E e mana achọrọ m ịma ihe niile ozizi niile

nke okwu Chineke nwere nye m.

- Ịmaara, n'imetụ akwụkwọ a n'ịmụ ya bụ ihe abụọ dị iche. Iji nwe obi ekele maka ya

site n'ebe dị anya banyere ụmụaka nwoke na ụmụnwaanyị, ụmụaka, ihe ha ga-agabiga

na gị na mụ n'aga m agụ akwụkwọ a taa nke akpọrọ Baịbụl

n'enweghị mkpagbu. Ọdị mfe ikwu nke a: agbara , ọkụ,

tụọ ha nkume, tiwaa ha afọ, maka ịgụ okwu a.

- Aga m amụ ya n'ụtụtụ, maọbụ n'uhuruchi, nke mere

n'aga m ebili n'elekere n'uche ọzọ dị ichọ, agara m ma mụọ ya n'akwụkwọ nsọ.

Ịhụrụ k'osi maa mma, n'ihe ọchọrọ ka anyị mara, n'ịnọdụrụ ebe ahụ

na anyammiri n'ịchọpụtara n'ihe enyere gị buru ibu.

Ya mere mgbe m n'amụ Baịbụl Kịng Jems

enwere m obi ike na ihe m ji n'aka bụ okwu Chineke site na mbido ruo na ngwụcha,

n'ọbụ otu ihe ahụ ruo n'awa n'esochi,

n'ihina echekwara ya n'ọbụkwa otu. Ya mere enwere m nnukwu obi ike mgbe ọbụla mmepere ya ma 'n'ezi

ihe site na ya na Sọnde na mgbe m ji ya ezi ihe na ọmụmụ akwụkwọ nsọ na Sọnde na mgbe m ji ya ezi ndị mmadụ oziọma

n'oge, amaara m n'ọbụ okwu Chineke, anyị n'ele anya

ịhụ okwu ahụ n'onwe ya n'ebube iji kwuputa

ihe ndị anyị n'amụ banyere ya na ndụ anyị niile.

- Chineke enweghị obiụtọ na ndị a wepụrụ amaokwu ụfọdụ, tinye ndịọzọ, tinye

ihe, wepụ ihe. Gaa na Mkpughe.

Mkpughe :; "Mana ana m agbara nwoke ọbụla nke nụrụ okwu

amụma ama. Ọbụrụ n'onye ọbụla etinye ihe na ya, Chineke,

ga-eti ya iheotiti nke edere n'akwụkwọ a". Ịgụtụla akwụkwọ

Mkpughe?Onwere ọtụtụ iheotiti n'akwụkwọ ahụ. Okwuru sị,

aga m eti gi iheotiti ahụ edekọrọ n'okwu ya. Mkpughe :; mana ọbụrụ n'onye

ọbụla ewepụ ihe n'akwụkwọ amụma a, Chineke

ga-ewepụ aha ya n'akwụkwọ nke ndụ, n'ala nsọ ahụ, na

ihe ndị edekọrọ n'akwụkwọ a". Mana ndị a gbanwere okwu Chineke

Baịbụl kwuru sị, ha atụfuola ohere enyere maka nzọpụta ha.

Okwuru sị, "Aga m ewepụ". Okwukwara, " n'otu aka ahụ isi wepụ ihe n'okwu m,

Aga m ewepụ aha ya n'akwụkwọ nke ndụ." Okwuru, "aga m ahụ n'azọpụtaghị

ya n'ihina omechuola Baịbụl ihu". Nke ahụ

n'egosi na Chineke ewepụtarala ya anya.

Oyiri ka " ọdịmma, Pastọ Jimenaz. Ekwenyere m. Aghọtara m. Enwere nrụrụaka na Baịbụl ndị a.

Ha n'emebi ozizi. Baịbụl Kịng Jems zuru oke. Baịbụl Kịng Jems

bụ okwu Chineke Aghọtara m. Kedu ihe m ga-eji ya eme?

Ọbụrụ n'ịchọpụta n'inwere okwu Chineke n'aka gị, ọbụghị echiche Chineke,

ọbụghị ihe ọgaara ikwu, maọbụ ihe anyị chere ọ ga-ekwu, mana okwu

Chineke, ọbụghị naani nke ahụ, mana mgbe inwere okwu Chineke

inweela Chineke, ọbụghị akwụkwọ a, mana mgbe ịmatara n'ọbụ okwu Chineke,

nna nke ahụ ga-eme ka ịgụọ Baịbụl.Nke ahụ ga-eme ka anyị bie ndụ

n'ihe Baịbụl n'ekwu. Onwere azịza nye ajụjụ gị niile maka ndụ.

Ikwuru sị, "Pastọ Jimenaz, abịara m na Vriti Baptist Chọọchị; abịaghị m ebe a ịmụ maka Baịbụl Kịng Jems

abịara m ebe a ịmụ

maka nzọpụta." Anyị mụtara maka nzọpụta na Baịbụl Kịng Jems.

"Abịaghị m ebea ịmụ maka okwu ndị dị iche iche. Abịara m ebe a ka nweta enyemaka maka ezinụlọ m."

Akwụkwọ a ga-enyere gị aka.

"Abịaghị m ebea ịmụ maka Baịbụl Kịng Jems. Abịara m ebe a

ịmụ ka m ga-esi zụlite ụmụ m". Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịzụlite ha.

Ọ ga-egbo nsogbu anyị niile. Ọ ga-ewetara gị nzọpụta. ỌỊ ga-eme ihe niile ịchọrọ ka omee.

N'ihi gịnị?n'ihina ọbụ okwu Chineke...

...nke enweghị ntụpọ, zuru oke, dịka Chineke si nye ya.

Onyere m obi ike ikwere n'okwu Chineke zuru oke. Ịmaara ihe mere

ọtụtụ mmadụ ejighị ekwere na Chineke taa, ha anaghị aga ụka, ọtụtụ ndị n'eto eto

n'ahapụzi ụlọụka n'ọnụọgụgụ dị elu ma ha anaghị alọghachi? N'ihina

vashọn Baịbụl ndịọhụrụ emebiela ọtụtụ ihe,

onwere mmejọ ndị emere na ya, nke mere na okwukwe ha nwere na Chineke nwụziri kpamkpam

Mana ọbụghị nke a. Ozuru oke. Vashọn Kịng Jems bụ okwu Chineke.

Gụọ ya.

Mụta ya.

Mụọ ya.

Buo ya n'isi.

Bie ndụ na ya.

Gwakwa ya ndịọzọ.

Ka anyị hulata kpe ekpere. Nna anyị nke bi n'eluigwe.

Onyenweanyị, anyị hụrụ gị na anya. Imeela n'okwu gị. Onyenweanyị imeela na

imeghị ka okwu gị si anyị n'aka pụọ. Mana ọbụ ibu ọrụ gị.

Ichepụtara ya. chekwa ya, ma nyekwa anyị ya

taa. Nna, anyị hụrụ gị n'anya. Ekwela ka anyị

pụọ ebe a taa ma chefuo okwu gị site n'ime ka osi na ntị akanri banye ma si na nke akaekpe pụọ Nyere anyị aka ịmata , " n' anyị nwere okwu Chineke;

aga m agụ ya. Aga m amụ ya. Aga m

ebi ndụ na ya." Anyị hụrụ gị na anya, onyenweanyị. N'aha gị dị nsọ, ana m ekpe. Amen.

Aga m achọ ịjụ gị ajụjụ.

Ịmaara n'odoro anya, n'ịnwụọ taa, ị ga aga eluigwe?

Inwere ike ịsị, "Amaghị m ma aga m aga eluigwe."

Onwere ike ichebeghị otu ahụ mbụ.

Mana Baịbụl gwara anyị n'ịma ma ịga aga eluigwe maọbụ ịgaghị aga.

Ugbu a, dịka Baịbụl si kwuo, ikwesịrị ịghọta ụfọdụ ihe

iji nweta nzọpụta. Nke mbụ bụ nke a:

Baịbụl n'ekwu na Rom :, "Anyị niile emehiela, anyị eruzighị otuto Chineke".

Baịbụl gwara anyị na "mmehie bụ mmejọ nke iwu."

Mgbe anyị mebiri iwu, anyị emehiela. Dịka amaokwu ahụ si kwuo, anyị nile emehiela.

Abụ m onye mmehie; ịbụ onye mmehie.

Ma ọ na-ewute n'onwere ụgwọrụ. Rom :, "ụgwọrụ mmehie

bụ ọnwụ". Ugbu a, okwu ahụ bụ "ụgwọrụ" pụtara ịkwụ ụgwọ. Ọbụ ihe

inwetara. Ọbụrụ na m gaa ọrụ, ha nye m ego. Ọbụ ụgwọrụ m. Mana n'ihi

mmehie m, ụgwọrụ ya bụ ọnwụ. " Maka ụgwọrụ mmehie

bụ ọnwụ". Ya mere mgbe anyị n'eche banyere ọnwụ, ụfọdụ ndị mmadụ n'eche n'ọbụ ọnwụ nkịtị,

Mana Mkpughe :-, mana etinyere ọnwụ

n'alammụọ n'ime ọkụ." (mgbe akpọtụụrụ alammụọ.) okwuru " Nke a bụ ọnwụ nke ugbo abụọ."

Onye ọbụla nke ahụghị aha ya n'akwụkwọ nke ndụ, aga atụnye ya n'ọkụ"

Ya mere dịka Baịbụl si kwuo, ụgwọrụ mmehie

abụghị naanị ọnwụ nkịtị, mana ọnwụ ugbo abụọ. Ikwuru sị, "Gịnị bụ ọnwụ nke ugbo abụọ?"

Itinye n'ọkụ. " Nke a bụ ọnwụ nke ugbo abụọ."

Ihe anyị n'enweta maka mmehie bụ ọnwụ: ọnwụ nkịtị, ọnwụ nke ugbo abụọ, nke

bụ itinye n'ime ọdọ ọkụ. Mkpughe : kwuru, "Mana ndịụjọ na

ndị ekweghị ekwe, ndị n'eme arụ, ndị n'egbu mmadụ, na ndị enweghị ihe eji ha eme, na

ndị n'eme anwansi, na ndị n'ekpere arụsị..." ndepụta ndị a dị egwu, ọbụghị ya?

ndị ogbu mmadụ, ndị enweghị ihe eji ha eme, ndị anwansi, ụfọdụ kwenyere, onye ogbu mmadụ,

"Ha ga aga ọkụ mmụọ." Mana lee anya n'okwuru sị, na ndịụjọ,

ndị ekweghị ekwe, ndị n'eme arụ, ndị ogbu mmadụ, ndị enweghị ihe eji ha eme,

na ndị n'eme anwansi, na ndị n'ekpere arụsị..." Mana na ngwụcha okwuru sị

"ma ndị ụgha, ga-enweta oke ha

n' oke ọkụ na brimstone: nke bụ ọnwụ nke ugbo abụọ." Ihe mere Chineke ji tinye

na mmehie nke ịgha ụgha na ngwụsị ya, nwere ihe ọchọrọ ime ka ọpụta ihe,

Ihe ahụ bụ nke a: anyị niile bụ ndị mmehie. Onye ọbụla aghala ụgha.

Ihe ọ na-ekwu bụ n'onweghị onye bụ onye eziomume; anyị niile emehiela; anyị

kwesịrị ị ga ọkụ mmụọ. Mana nke ahụ bụ ozi ọjọọ. Abụ m onye mmehie; ịbụ onye mmehie, anyị niile

bụ ndị amaara ikpeọnwụ na ọkụ mmụọ. Mana oziọma bụ

nnukwu iheọma. Rom : sịrị, " ụgwọrụ mmehie bụ ọnwụ". Anyị ghọtara nke ahụ

ugbua. Mana amaokwu ya nke abụọ sịrị, mana onyinye nke Chineke bụ

ndụ ebighị ebi site n'a Jizọs Kraịst onyenweanyị."

Baịbụl gwara anyị n'onwere onyinye Chineke chọrọ inye anyị nke bụ ndụ ebighị ebi. Mana na Efesọs :-

Baịbụl gwara anyị "site na amara ya ka a ga-eji zọpụta anyị site na okwukwe". Okwu ahụ bụ "amara"

pụtara mmadụ inweta ihe erurughị ya. Irughị inweta ya;

ịkwụghị ụgwọ ya. "Azọpụtara gị" bụ mkpọtụrụ nke nchebe pụọ n'alammụọ,

maka n'ihina achọghị m ịga ebe ahụ Echekwara m n'ịchọghị ịga ebe ahụ.

Okwu ahụ bụ " okwukwe" pụtara ikwere. Ọsịrị. Site na amara k'eji azọpụta

site n'okwukwe;nke abụghị nke anyị". Onweghị ihe gbasara gị. Ihe a bụ ihe mere:

"ọbụ onyinye si n'aka Chineke: ọbụghị ọrụ, ka onye ọbụla ghara itu ọnụ." Onyinye bụ

ihe onweghị ọrụ achọrọ gị n'aka maka ya. Onyinye bụ ihe enyere gị.

onwere onye kwụrụ ụgwọ ya, ọbụghị gị. Mana nye gị onyinye

ma gwa gị ka inye m ego maka ya, nke ahụ abụghịzi onyinye,

mana agwara m gị ka imee ihe maka ya, nke ahụ abụghịzi onyinye. Ugbu a, onyinye

enweghị ihe ọ ga-ewe gị, mana ọ ga-ewe onye nyere gị ya ihe.

Onyinye nke Chineke dị otu ahụ. Jizọs bụ ya kwụrụ ụgwọ ahụ.

Rom : sịrị, " mana Chineke nyefere anyị ịhụnanya ya mgbe anyị

ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị." Jọn :, bụ amaokwu kacha amaokwu ndịọzọ

na Baịbụl kwuru sị, Ma Chineke hụrụ ụwa n'anya nke ukwu, ma

nye ọkpara ọmụrụ naanị, ka onye ọbụla nke kwere na ya ghara ịnwụ anwụ kama ka anyị nwe ndụ ebighị ebi."

Oziọma ahụ bụ nke a: Nwaanyị amaghị nwoke mụrụ Jizọs.

obiri ndụ n'enweghị mmehie, omeghị mmehie ọbụla. Ọnwụrụ n'obe,

elie ya. Baịbụl gwara anyị na mkpụrụ obi ya gara na alammụọ ihe dị abalị atọ,

ma si n'ili bilie, ọbụghị maka mmehie nke ya,

n'ihina onweghị mmehie ọbụla. Leenu

akwụọla ụgwọ mmehie ahụ. Mana ikwesịrị ịghọta

ihe banyere onyinye ahụ: Jọn : sịrị "ndụ ebighị ebi". Onyinye ahụ bụ

ndụ ebighị ebi. Okwu ahụ bụ " ebighị ebi" pụtara n'ọga eru mgbe ebighị ebi. Ndụ nke

ga-eru mgbe ebighị ebi. Ọgaghị agwụ agwụ. Jọn : sịrị "ndụ ebighị ebi".

"Ebighị ebi" pụtara n'ọgaghị agwụ agwụ. Jọn : kwuru "ndụ ebighị ebi". Rom

: sịrị"ndụ ebighị ebi". Ebe niile na Baịbụl, ị ga-ahụ nkọwa dị otu a:

ndụ ebighị ebi, ndụ agaghị agwụ agwụ, ndụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Dịka Jọn :, ị ga-enweta ya mgbe ọbụla ikwere. "onye ọbụla nke kwere

na nwa ahụ ga-enwe ndụ ebighị ebi". Ugbu a ụfọdụ chere, ọdịmma,

aga m enweta nzọpụta, ma m nweta ya, ma mee iheọjọ ọbụla, dịka

ịkwa iko, igbu mmadụ, igbu onwe m, mgbe ahụ

Chineke ga-ewere nzọpụta m". Mana owere ya, ndụ ahụ abụzighị mgbe ebighị ebi. Lee, anyị

aghọtala na nzọpụta abụghị ihe anyị ga-enweta otu ahụ,

ọbụrụ n'anyị nweta ya, ọbụghị ihe anyị ga-edebe. Baịbụl kwuru na Taịtọs :, "nke dabeere n'olileanya ndụ ebighị ebi

nke Chineke onye n'agaghị agha ụgha kwere nkwa ya ọtụtụ oge gara aga.

Lee olileanya ndụ ebighị ebi anyị bụ nke a:Chineke agaghị agha ụgha. Ọbụrụ na Chineke ekwe m nkwa

ndụ ebighị ebi. Chezie ihe ga-emenu. Ọbụ ndụ ebighị ebi. Okwere m nkwa ndụ ebighị ebi

nke pụtara n'ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ikwuru sị," ọbụrụkwanụ na mụ

emee ihe jọrọ njọ"? Ọbụghị anyị ka odịịrị. Onweghị ihe gbasara m.

Ọbụ onyinye nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Lee ugbu a naanị ihe ị ga-eme:

Dịka onyinye ọbụla ọzọ, inweere onwe gị ịnabata ya maọbụ jụ.

inwere ike ịjụ, "ọdịmma, kedu ka m ga-esi nabata onyinye Chineke?" Rom :

kwuru sị: "ọbụrụ na..."

ọchụchọ. okwuru sị, " ọbụrụ n'ị ga-eji ọnụ gị kwuputa Jizọs..."

okwu ahụ bụ "kwuputa" pụtara ịnakwere. Ikwuru, " Gịnị ka m na-anakwere!? ọdịmma, ịnakwere

n'ịbụ onye mmehie. Ịnakwere n'ikwesịrị

ị ga ọkụ mmụọ. Mana ị na-arịọ ka agbaghara gị mmehie. Okwuru sị," ọbụrụ n'ị ga-eji

ọnụ kwuputa Jizọs..."ọkarrịrị okwu ọnụ. Okwukwara sị,

".. ma kwere n'obi gị na Chineke kpọlitere ya n'ọnwụ..

..."ị na-ekwere na Jizọs Kraịst nwụrụ n'obe, elie ya,

osikwa n'ọnwụ bilie dịka ụgwọ akwụrụ maka mmehie anyị.

Were ọnụ gị kwuputa na Onyenweanyị Jizọs, ma kwere n'obi gị na

na Chineke kpọlitere ya n'ọnwụ," ka Baịbụl kwuru , "a ga-azọpụta gị."

Okwughị n'enwere ike ịzọpụta gị. Okwughị ka inwee olileanya n'aga azọpụta gị,

Chineke kwuru, "aga m azọpụta gị maọbụrụ n'ikwuputa mmehie gị ma kwere

n'obi gị."Mara n'ọbụghị iwu n' ị ga agarịrị ụka. Okwughị n' ị ga-emerịrị baptizim.

Okwughị n'ị ga-akwụsị mmehie gị. Okwughị n'ịga-eme ihe ọbụla;

Naanị kwere ka ochebe gị. Ikwere na Kraịst

n'obi gị, ikwere na Jizọs Kraịst nwụrụ n'obe maka mmehie gị

ma elie ya, bilie n'ili, ọchọrọ inye gị onyinye,

ọbụ ndụ ebighị ebi, ya mere gịnị mere ị gaghị ekwuputa ugbu a?

Aga ma achọ inyere gị aka wepụta ekpere. Ọbụrụ n'ikwere na nke ahụ,soro m kpee ekpere

Soro m kpee ekpere ugbu a:

Ikpee ekpere ahụ ma kwere n'obi gị, dịka Baịbụl si kwuo,

azọpụtala gị. Iweela ndụ ebighị ebi. Ekeele m gị.

 

 

 







mouseover